Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 11:21 - Bible Nso

21 Joshua we bia na mb͕e ahu, bipu ndi Anak ahu n'ugwu, bú nime Hebron, na nime Debia, na n'Anab, na n'ugwu Juda nile, na n'ugwu Israel nile: ha na obodo nile ha ka Joshua wezugara ka ebibie ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Nʼoge ahụ kwa, Joshua gara kpochapụ ndị Anak ahụ bi nʼala ugwu ugwu, ya bụ, na Hebrọn, na Debịa, na Anab, na ala ugwu ugwu Juda, na ala ugwu ugwu Izrel. O gburu ha niile, laa obodo ha nʼiyi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 11:21
18 Iomraidhean Croise  

N'ezie n'efu ka nzọputa ahu bu nke anēle anya ya site n'ugwu ntà di iche iche, bú ìgwè madu n'elu ugwu nile: n'ezie na Jehova, bú Chineke-ayi, ka nzọputa Israel di.


Otú a ka Jehova siri, Ka onye nke mara ihe ghara inya isi n'amam-ihe-ya, ka dike ghara inya isi n'idi-ike-ya, ka ọgaranya ghara inya isi n'àkù-ya:


Ma Mu onwem kpochapuru ndi-Amorait n'iru ha, onye idi-elu-ya di ka idi-elu osisi cedar, onye di ike ka ọ bu kwa, dika osisi oak; ma ekpochapurum nkpuru-ya n'elu na nkpọrọgwu-ya nile n'okpuru.


N'ebe ahu ka ayi hu-kwa-ra ndi-Nefilim, bú umu Anak, ndi sitere na ndi-Nefilim: ayi we di n'anya onwe-ayi dika ogugu, ọ bu kwa otú a ka ayi di n'anya-ha.


Òle ebe ayi onwe-ayi nārigo? umu-nne-ayi emewo ka obi-ayi ghara idi ike, si, Ọ bu ndi di uku di kwa ogologo kari ayi, na obodo uku ewusiri ike rue elu-igwe; ọzọ kwa, umu Anakim ka ayi huru n'ebe ahu.


ndi di uku, di kwa ọtutu, di kwa ogologo, dika ndi Anak; ma Jehova kpochapuru ha n'iru ha; ha we napu ha ala-ha, bichie n'ọnọdu ha:


otù ndi di uku di kwa ogologo, bú umu ndi Anak, ndi gi onwe-gi mara, ndi gi onwe-gi nuwo-kwa-ra okwu bayere ha, si, Ònye gēguzo onwe-ya n'iru umu Anak?


Eze ndia nile na ala-ha ka Joshua were n'otù mb͕e, n'ihi na Jehova, bú Chineke Israel, nēburu Israel agha.


M'we hu, ma le, inyinya ọcha, Onye nānọkwasi ya nwe-kwa-ra uta; ewe nye Ya okpu-eze: O we puta nēmeri, ya na ka O we meri.


Ha we nye Keleb Hebron, dika Moses kwuru: o we napu umu Anak atọ ala-ha n'ebe ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan