Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 11:2 - Bible Nso

2 ziga-kwa-ra ndi-eze ndi nọ n'Ugwu, bú n'ugwu, na n'Araba nke di na Ndida Kinerot, na n'ebe di ala ala, na n'ebe nile di elu nke Doa n'Ọdida-anyanwu, ozi;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 na ndị eze bi nʼobodo ugwu ugwu, na ndị bi nʼime Araba, na ndịda Kineret, na ndagwurugwu ọdịda anyanwụ, na nʼime Nafọt Doa, nke dị nʼọdịda anyanwụ,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 11:2
14 Iomraidhean Croise  

Ben-hedad we ge eze, bú Esa, nti, zite ndi-isi usu nile nke ndi-agha o nwere imegide obodo nile nke Israel, o we tib͕ue Ijon, na Dan, na Ebel-bet-meaka, na Kinerot nile, tiyere ala nile nke Naftali.


Ben-abinadab, n'ebe nile di elu nke Doa; Tafat nwa Solomon ka ọ nwere na nwunye:


ókè-ala ahu gārida kwa site na Shefam rue Ribla, n'akuku Iru anyanwu Ain; ókè-ala ahu gārida kwa, we metu akuku oké osimiri Kineret nke chere iru n'Iru-anyanwu:


Ma Meri biliri na mb͕e ahu, ga elu-ala ọsọsọ, bà n'otù obodo nke Juda;


Ma o rue, mb͕e ìgwè madu nādagide Ya nānu kwa okwu Chineke, na Ya onwe-ya nēguzo n'usọ ọdọ-miri Genesaret;


Joshua we tib͕ue ala ahu nile, bú ugwu, na Negeb, na ebe di ala ala, na nkpọrube nile, na eze-ha nile; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru: o wezuga ihe nile nēku ume ka ebibie ya, dika Jehova, bú Chineke Israel, nyere iwu.


Ndikom Gibeon we zigara Joshua ozi rue ọmuma-ulo-ikwū rue Gilgal, si, Arala ndi-orù-gi aka; rigokute ayi ngwa ngwa, zọputa ayi, ye-kwa-ra ayi aka: n'ihi na eze nile nke ndi-Amorait ndi bi n'ugwu achikọtawo onwe-ha imegide ayi.


Joshua we were ala ahu nile, bú ugwu, na Negeb nile, na ala Goshen nile, na ebe di ala ala, na Araba, na ugwu Israel, na ebe di ala ala ya;


Joshua we bia na mb͕e ahu, bipu ndi Anak ahu n'ugwu, bú nime Hebron, na nime Debia, na n'Anab, na n'ugwu Juda nile, na n'ugwu Israel nile: ha na obodo nile ha ka Joshua wezugara ka ebibie ha.


eze Doa n'ebe di elu nke Doa, otù; eze Goim nime Gilgal, otù;


na Araba ahu rue oké osimiri Kinerot, n'akuku ọwuwa-anyanwu, ru kwa oké osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú, n'akuku ọwuwa-anyanwu, n'uzọ ije Bet-jeshimot; na na Ndida, n'okpuru nkpọrube Pisga:


na nime ndagwurugwu ahu, Bet-heram, na Bet-nimra, na Sukot, na Zafon, bú nke fọduru nke ala-eze Saihon, bú eze Heshbon, Jọdan na ókè-ala-ya, rue nsọtu oké osimiri Kineret n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu.


Manase nwekwara obodo n'Isaka na n'Asha, bú Bet-shean na umu-obodo-ya, na Ibleam na umu-obodo-ya, na ndi bi na Doa na umu-obodo-ya, na ndi bi na En-doa na umu-obodo-ya, na ndi bi na Teanak na umu-obodo-ya, na ndi bi na Megido na umu-obodo-ya, bú ebe di elu atọ ahu.


Manase anapughi ndi bi na Bet-shan na umu-obodo-ya, na ndi bi na Teanak na umu-obodo-ya, na ndi bi na Doa na umu-obodo-ya, na ndi bi na Ibleam na umu-obodo-ya, na ndi bi na Megido na umu-obodo-ya, ala-ha: ma ndi Kenean jisiri ike ibiri n'ala ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan