18 Ọtutu ubọchi ka Joshua busoro eze ahu nile agha.
18 O were Joshua ogologo oge imeri obodo ndị a niile na eze ha nʼagha.
site n'ugwu Halak, nke nārigo rue Sia, we rue Beal-gad nime ndagwurugwu Lebanon n'okpuru ugwu Heamon: eze-ha nile ka o were, tib͕ue ha, me ka ha nwua.
Ọ dighi obodo nke mere ka ha onwe-ha na umu Israel di n'udo, ma-ọbughi ndi-Haivait ndi bi na Gibeon: ha nile ka ha were n'agha.
Joshua we were ala ahu nile, dika okwu nile si di nke Jehova gwara Moses; Joshua we nye ya Israel ka ọ buru ihe-nketa, dika esi kè ha n'òkè n'òkè dika ebo nile ha si di. Ala ahu we rapu ibu-agha, di jū.