ha were ya, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na eze-ya, na obodo-ya nile, na madu nile nke di nime ya; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru, dika ihe nile si di nke o mere Eglon; o wezuga ya ka ebibie ya, na madu nile nke di nime ya.
o were ya, na eze-ya, na obodo-ya nile; ha were ọnu mma-agha tib͕ue ha, wezuga madu nile nke di nime ya ka ebibie ha; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru: dika o mere Hebron, otú a ka o mere Debia, me kwa eze-ya; dika ọ me-kwa-ra Libna, me kwa eze-ya.