Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 10:36 - Bible Nso

36 Joshua we si n'Eglon rigo, ya na Israel nile, rue Hebron; ha buso ya agha:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

36 Mgbe Joshua na ndị Izrel sitere nʼEglọn pụọ, ha gara Hebrọn buso ya agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 10:36
17 Iomraidhean Croise  

Abram we ropu ulo-ikwū-ya, bia biri n'etiti osisi terebinth nke Mamre, nke di nime Hebron, o wuere Jehova ebe-ichu-aja n'ebe ahu.


Ndia bu kwa ọnu-ọgugu ndi-isi nke ndi ejikere iso usu-ndi-agha; ha biakutere Devid nime Hebron ichighari ala-eze Sọl nye ya, dika okwu-ọnu Jehova si di.


na Zedok, bú nwa-okorọbia nke bu dike bu dìnkpà, na nke ulo nna-ya orú ndi-isi na abua.


na Zora, na Ajalon, na Hebron, nke di na Juda na Benjamin, bú obodo ewusiri ike.


Ha we rigo nime Negeb, biarue Hebron; ma n'ebe ahu ka Ahiman na Sheshai na Talmai, bú umu Anak, nọ (Ma ewuru Hebron arọ asa tutu ewue Zoan n'Ijipt.)


Adoni-zedek, bú eze Jerusalem, we zigara Hoham, bú eze Hebron, ziga-kwa-ra Piram, bú eze Jamut, ziga-kwa-ra Jafia, bú eze Lekish, ziga-kwa-ra Debia, bú eze Eglon, ozi, si,


ha were ya n'ubọchi ahu, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, madu nile nke di nime ya ka ọ wezugara ka ebibie ha n'ubọchi ahu, dika ihe nile si di nke o mere Lekish.


ha were ya, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na eze-ya, na obodo-ya nile, na madu nile nke di nime ya; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru, dika ihe nile si di nke o mere Eglon; o wezuga ya ka ebibie ya, na madu nile nke di nime ya.


Eze ise ndi-Amorait, bú eze Jerusalem, na eze Hebron, na eze Jamut, na eze Lekish, na eze Eglon, we chikọta onwe-ha, rigo, ha onwe-ha na ọmuma-ulo-ikwū-ha nile, we ma ulo-ikwū-ha imegide Gibeon, we buso ya agha.


Ọ nye-kwa-ra Keleb Jefune òkè n'etiti umu Juda, dika okwu-ọnu Jehova gwara Joshua si di, bú Kiriat-aba; Aba bu nna Anak (nke ahu bu Hebron).


na Humta, na Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron), na Zioa; obodo iteghete na obodo ntà ha.


Umu Eron, bú onye-nchu-àjà, ka ha nyere Hebron na ebe-ita-nri-ya, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Libna na ebe-ita-nri-ya nile;


Juda we jekuru ndi Kenean ndi bi na Hebron: (ma aha Hebron na mb͕e gara aga bu Kiriat-aba:) na tib͕ue Sheshai, na Ahiman, na Talmai.


Ha we nye Keleb Hebron, dika Moses kwuru: o we napu umu Anak atọ ala-ha n'ebe ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan