Edom we si n'okpuru aka Juda jehie, rue ta: mb͕e ahu ka Libna siri n'okpuru aka-ya jehie n'otù mb͕e ahu: n'ihi na ọ rapuru Jehova, bú Chineke nke nna-ya-hà.
Joshua we were Makeda n'ubọchi ahu, were ọnu mma-agha tib͕ue ya na eze-ya; o wezugara ha na madu nile nke di nime ya ka ebibie ha, ọ dighi onye fọduru ọ rapuru: o me eze Makeda dika o mere eze Jeriko.
Jehova we nye kwa ya na eze-ya n'aka Israel; o were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na madu nile nke di nime ya; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru nime ya; o me eze-ya dika ọ mere eze Jeriko.
i gēme kwa Ai, me kwa eze-ya, dika i mere Jeriko, me kwa eze-ya: nání, na unu gālutara onwe-unu n'agha ihe-nkwata-ya, na anu-ulo-ya: doro onwe-gi ndi nēru nbì megide obodo ahu n'azu ya.
Ọ we kwuba eze Ai n'osisi rue mb͕e anyasi: ma mb͕e anyanwu nāda Joshua nyere iwu, ha we si n'osisi weda ozu-ya, tuda ya n'oghere ọnu-uzọ-ama obodo, guzo n'elu ya oké obo nkume, rue ta.