Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 10:14 - Bible Nso

14 Ọ dighi kwa ubọchi di ka ubọchi ahu n'iru ya ma-ọbu n'azu ya, na Jehova gere nti olu madu: n'ihi na Jehova nēburu Israel agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 O nweghị ụbọchị ọzọ dịka ụbọchị ahụ nʼoge niile gara aga. Ọ dịbekwaghị ụbọchị yiri ụbọchị ahụ ruo taa. Ọ bụ ụbọchị Onyenwe anyị mere ka anyanwụ na ọnwa kwụsị, nʼihi naanị ekpere otu nwoke. Nʼihi na Onyenwe anyị na-eburu Izrel agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 10:14
13 Iomraidhean Croise  

Jehova gēburu unu agha, ma unu onwe-unu gāb͕a nkiti.


O wezuga akpuru ukwu nke ub͕ọ-ala-ha, me ka ọ di ha arọ́ ime ka ha nāga: ndi Ijipt we si, Ka ayi b͕apu n'iru Israel; n'ihi na Jehova nēburu ha agha megide ndi Ijipt.


le, M'nēme ka onyinyo nke di n'ebe-nrigo, nke ridaworo n'ebe-nrigo Ehaz site n'anyanwu, ka ọ la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri. Anyanwu we la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri n'ebe-nrigo ahu nke ọ ridaworo n'elu ya.


Jehova gāpu kwa, buso mba ahu nile agha, dika n'ubọchi O buru agha n'ubọchi ilu-ọ̀gù.


Onye-nwe-ayi we si, Ọ buru na unu nwere okwukwe dika nkpuru mustard, unu gāsi osisi sycamine nka, Ka eropu gi, ku kwa gi n'oké osimiri; ọ gāṅa kwa unu nti.


Jehova, bú Chineke-unu, Onye nēje n'iru unu, Ya onwe-ya gēburu unu agha, dika ihe nile si di nke O mere bayere unu n'Ijipt n'anya-unu;


Joshua we lata, ya na Israel nile, rue ọmuma-ulo-ikwū rue Gilgal.


Eze ndia nile na ala-ha ka Joshua were n'otù mb͕e, n'ihi na Jehova, bú Chineke Israel, nēburu Israel agha.


unu onwe-unu ahuwo kwa ihe nile nke Jehova, bú Chineke-unu, meworo mba ndia nile n'ihi unu; n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu onye nāluru unu ọ̀gù.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan