Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 10:12 - Bible Nso

12 Mb͕e ahu Joshua gwara Jehova okwu n'ubọchi Jehova rara ndi-Amorait nye n'iru umu Israel; o we si n'anya Israel, Anyanwu, guzo du n'elu Gibeon; Gi Ọnwa kwa, na ndagwurugwu Ajalon.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị mere ka ndị Izrel lụgbuo ndị Amọrait. Joshua gwara Onyenwe anyị okwu nʼihu ndị Izrel niile sị, “Gị, anyanwụ, guzo nʼotu ebe na mbara eluigwe Gibiọn. Gị, ọnwa, guzokwa nʼotu ebe na mbara eluigwe na Ndagwurugwu Aijalon”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 10:12
29 Iomraidhean Croise  

Abnea nwa Nea, na ndi-orù Ish-boshet nwa Sọl, we si na Mahanaim puta rue Gibeon.


Hezekaia we si, Ọ di nfe ka onyinyo ruru nzọ-ukwu ebe-nrigo iri: é-è, kama ka onyinyo la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri.


Aisaia, bú onye-amuma, we kpọkue Jehova: O we me ka onyinyo la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri, nke ọ ridara na nzọ-ukwu ebe-nrigo Ehaz.


Aisaia we si, Nka gāburu gi ihe-iriba-ama sitere n'aka Jehova, na Jehova gēme ihe a nke O kwuru: onyinyo, ọ̀ gāga n'iru nzọ-ukwu ebe-nrigo iri, ma-ọbu la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri?


na Beria, na Shema; ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi bi n'Ajalon, ha onwe-ha mere ka ndi bi na Gat b͕alaga;


na Zora, na Ajalon, na Hebron, nke di na Juda na Benjamin, bú obodo ewusiri ike.


Onye nāgwa anyanwu okwu, o we ghara iwa; Ọ nākachi kwa kpakpando akàrà.


Tonu Ya, anyanwu na ọnwa: Tonu Ya, kpakpando nile nke ìhè.


N'uwa nile ka eriri-ọtùtù-ha puworo jezue, Na nsọtu elu-uwa dum madu bi ka okwu-ha puwo-kwa-ra jezue. O doworo anyanwu ulo-ikwū nime ha.


Gi nwe ehihie, ọzọ kwa, Gi nwe abali: Gi onwe-gi edoziwo ihe nēnye ìhè na anyanwu.


N'ihi na dika n'ugwu Perazim, otú a ka Jehova gēbili; dika na ndagwurugwu Gibeon, otú a ka Ọ gēwe oké iwe; ilu ọlu-Ya - nke onye ala ọzọ ka ọlu-Ya bu; na ifè òfùfè-Ya - nke onye ala ọzọ ka òfùfè-Ya bu.


le, M'nēme ka onyinyo nke di n'ebe-nrigo, nke ridaworo n'ebe-nrigo Ehaz site n'anyanwu, ka ọ la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri. Anyanwu we la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri n'ebe-nrigo ahu nke ọ ridaworo n'elu ya.


Anyanwu-gi agaghi-ada kwa ọzọ, ọnwa-gi agaghi-ewepu kwa onwe-ya: n'ihi na Jehova gāghọrọ gi ìhè ebighi-ebi, ubọchi nile nke iru-újú-gi ewe zue ezu.


O rue, n'arọ ahu, na nmalite ọbubu-eze Zedekaia, bú eze Juda, n'arọ nke-anọ, n'ọnwa nke-ise, na Hananaia nwa Azua, bú onye-amuma, nke sitere na Gibeon, gwaram okwu n'ulo Jehova, n'anya ndi-nchu-àjà na ndi Israel nile, si,


Ma Mu onwem kpochapuru ndi-Amorait n'iru ha, onye idi-elu-ya di ka idi-elu osisi cedar, onye di ike ka ọ bu kwa, dika osisi oak; ma ekpochapurum nkpuru-ya n'elu na nkpọrọgwu-ya nile n'okpuru.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), na M'gēme ka anyanwu da n'etiti-ehihie, M'gēme kwa ka uwa b͕a ọchichiri mb͕e chi bọchara abọcha.


Ma Jehova nọ n'ulo uku Ya di nsọ: dere du n'iru Ya, gi uwa nile.


Anyanwu na ọnwa guzoro n'ebe-obibi-ha; N'ìhè àkú-Gi nile mb͕e ha nāga, N'onwunwu nke ube-Gi nēb͕upu àmùmà.


Dere du, unu anu-aru nile, n'iru Jehova: n'ihi na O siwo n'ebe-obibi-Ya di nsọ teta.


nke jewo-kwa-ra fè chi ọ bula ọzọ òfùfè, we kpọ isi ala nye ha, ma-ọbu inye anyanwu, ma-ọbu inye ọnwa, ma-ọbu inye ihe ọ bula nime usu ihe elu-igwe, nke m'nēnyeghi n'iwu;


ka i we ghara kwa iweli anya-gi abua le elu-igwe, hu anyanwu na ọnwa na kpakpando, bú usu nile nke ihe elu-igwe, ewe duhie gi, i we kpọ isi ala nye ha, fè ha, bú ihe nke Jehova, bú Chineke-gi, kesaworo ndi nile n'okpuru elu-igwe nile.


Anyanwu we guzo du, ọnwa guzo-kwa-ra, Rue mb͕e mba ahu bọsiri ọ́bọ̀ n'aru ndi-iro-ha. Èdeghi nka n'akwukwọ Jasha? Anyanwu we guzo n'etiti elu-igwe, o meghi kwa ngwa ida ihe ra ka otù ubọchi zuru ezu.


na Shaalabin na Ajalon, na Itla;


na Ajalon na ebe-ita-nri-ya nile, na Gat-rimon na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ.


Ilon, bú onye Zebulun, we nwua, elìe ya n'Ajalon n'ala Zebulun.


N'elu-igwe ka ha si bū agha, Kpakpando si n'uzọ nile ha atuliri atuli buso Sisera agha.


Samuel we kpọkue Jehova; Jehova we nye éb͕è-elu-igwe na miri-ozuzo ubọchi ahu: ndi Israel nile we tua egwu Jehova na Samuel nke-uku.


Ha we tib͕ue ufọdu nime ndi Filistia n'ubọchi ahu site na Mikmash rue Ajalon: ndi Israel we da #mbà nke-uku.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan