Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jona 4:9 - Bible Nso

9 Chineke we si Jona, Ì nēme nke-ọma n'iwe iwe di ọku bayere ogili-ub͕a ahu? Ọ si, Anameme nke-ọma n'iwe iwe di ọku rue ọnwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ma Chineke sịrị Jona, “Ọ bụ ihe ziri ezi ka i wee iwe maka osisi a?” Ọ sịrị, “E, ana m ewe oke iwe, ọ bụladị na m chọrọ ịnwụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jona 4:9
13 Iomraidhean Croise  

Ehab we ba n'ulo-ya n'obi arọ́ na nb͕aru-iru, n'ihi okwu nke Nebot, bú onye Jezreel, gwara ya: n'ihi na ọ siri, M'gaghi-enye gi ihe-nketa nnam-hà. O we dina n'ihe-ndina-ya, chigharia iru-ya, o righi kwa nri.


Ọ nādọka onwe-ya n'iwe-ya. Àgārapu uwa n'ihi gi? Ma-ọbu àgākwapu oké nkume n'ọnọdu-ya?


N'ihi na lezie anya ka ọnuma ghara irafu gi site n'otiti-ihe; Ekwe-kwa-la ka iba-uba nke ihe-nb͕aputa wezuga gi.


N'ihi na nkpasu-iwe nēb͕u onye b͕agọro ab͕ago n'uche-ya, Ekworo nēme kwa ka onye nenweghi uche nwua.


O we jọ Jona ajọ njọ nke-uku, iwe-ya ewe di ọku.


Jehova we si, Gi onwe-gi mere ogili-ub͕a nka ebere, bú ihe nke i nādọb͕ughi onwe-gi n'ọlu n'ihi ya, nke i nēmeghi kwa ka ọ di uku; nke tolitere n'otù abali, la kwa n'iyì n'otù abali:


O rue, mb͕e anyanwu wara, na Chineke guputara otù ifufe Iru-anyanwu di ọku; anyanwu we tikwasi Jona n'isi, ike we gwusia ya, o we riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, Ọ kam nma inwu ọnwu kari idi ndu.


Mb͕e ahu Ọ si ha, Ọ nēwuta nkpuru-obim nke-uku, rue ọnwu: nọgidenu n'ebe a, som nēche nche.


N'ihi na nwuta dika Chineke chọrọ nālu ọlu nchèghari rue nzọputa, bú nchèghari nke anāpughi ikwa uta bayere ya: ma nwuta nke uwa nāluputa ọnwu.


N'ubọchi ahu madu gāchọ kwa ọnwu, ha agaghi-ahu kwa ya ma-ọli; agu inwu ọnwu gāgu kwa ha, ọnwu we b͕anari ha.


O rue, mb͕e o were okwu-ya nile kpagide ya ubọchi nile, sob͕u kwa ya, na nkpuru-obi-ya enweghi ntachi-obi rue ọnwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan