Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jona 4:8 - Bible Nso

8 O rue, mb͕e anyanwu wara, na Chineke guputara otù ifufe Iru-anyanwu di ọku; anyanwu we tikwasi Jona n'isi, ike we gwusia ya, o we riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, Ọ kam nma inwu ọnwu kari idi ndu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 O ruo, mgbe anyanwụ wara, Chineke mere ka ifufe na-ekpo ọkụ site nʼọwụwa anyanwụ, anyanwụ a chara Jona nʼisi nke ukwuu nke mere nʼike gwụsịrị ya. Ọ rịọrọ ka ọnwụ gbuo ya, na-asị, “ọ ga a kaara m mma na m nwụrụ anwụ, karịa na m dị ndụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jona 4:8
23 Iomraidhean Croise  

Ma, le, oko ọka asa, nke fikpọrọ afikpọ, nke ifufe Iru-anyanwu chakpọkwara achakpọ, nēpuso ha n'azu.


Ma ya onwe-ya jere ije otù ubọchi n'ọzara, bia nọdu n'okpuru otù osisi broom: ọ riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, O zuwo; ub͕u a, Jehova, wepu ndum; n'ihi na mu onwem adighi nma kari nnam-hà.


Ehab we ba n'ulo-ya n'obi arọ́ na nb͕aru-iru, n'ihi okwu nke Nebot, bú onye Jezreel, gwara ya: n'ihi na ọ siri, M'gaghi-enye gi ihe-nketa nnam-hà. O we dina n'ihe-ndina-ya, chigharia iru-ya, o righi kwa nri.


Ọ si ya, Dika otù nime ndinyom nzuzu si ekwu, otú a ka i nēkwu. Àyi gānara kwa ezi ihe n'aka Chineke, ghara inara ihe ọjọ? Nihe a nile Job ejighi eb͕ub͕ere-onu-ya mehie.


Nkpuru-obim we rọputa ntọb͕u, Na ọnwu kari ọkpukpum ndia.


Anyanwu agaghi-etib͕u gi n'ehihie, Ọnwa agaghi-etib͕u kwa gi n'abali.


Aghọrọm onye-ob͕i, adighm-asaghe ọnum; N'ihi na Gi onwe-gi mere ya.


Ekwela ka akpasue gi iwe ọsọsọ nime mọ-gi: n'ihi na nkpasu-iwe nwere ọnọdu-ya n'obi ndi-nzuzu.


Elelam anya, n'ihi na mu onwem nēji nji, N'ihi na anyanwu achawom. Umu nke nnem wesaram iwe di ọku, Ha dorom onye-nche ubi-vine-ha nile; Ma ubi-vine nkem, nke m'nwere, ka m'nēcheghi.


Agu agaghi-agu ha, akpiri agaghi-akpọ kwa ha nku; miri na anyanwu agaghi-amab͕u kwa ha: n'ihi na Onye nwere obi-ebere n'aru ha gēdu ha, ọ bu kwa n'akuku isi-iyi nile juputara na miri ka O gēdu ha nwayọ.


Ewe ropu ya n'ọnuma, n'ala ka atudara ya, ifufe Iru-anyanwu we me ka nkpuru-ya kpọnwua: ab͕ajipuru nkpa-n'aka-ya nile di ike, ha we kpọnwua; ọku ripiara ha.


Ọ bu ezie na ya onwe-ya nāmi nkpuru n'etiti umu-nne-ya, ma ifufe Iru-anyanwu gābia, bú ifufe Jehova nke nēsi n'ọzara fegota, ọmi-ya ewe ta, isi-iyi-ya gāmikọ kwa: nke ahu gāpunara ya àkù nke ihe ọ bula anāchọsi ike.


Moses we si Eron, Nka bu ihe Jehova kwuru, si, N'aru ndi nābiarum nso ka agēdom nsọ, ọ bu kwa n'iru ndim nile ka agāsọpurum. Eron we b͕a nkiti.


Jehova we guputa otù azù uku ilo Jona; Jona we nọ n'afọ azù ahu ubọchi atọ ehihie na abali.


Ma Jehova tubàra ifufe di uku n'oké osimiri, oke ifufe di uku we di n'oké osimiri, ewe chè na ub͕ọ gētiwa.


Ma ub͕u a, Jehova, biko, wepu ndum n'arum; n'ihi na ọ kam nma inwu ọnwu kari idi ndu.


Chineke we si Jona, Ì nēme nke-ọma n'iwe iwe di ọku bayere ogili-ub͕a ahu? Ọ si, Anameme nke-ọma n'iwe iwe di ọku rue ọnwu.


si, Ndi-ikpe-azu a luru otù hour, i we me ka ayi na ha ra, ayi ndi būru ibu arọ́ nke ubọchi ta, ya na ifufe di ọku.


Ka ha ra, bú ndi Mu onwem huru n'anya, anamatu ha nmehie ha n'anya, zí kwa ha ihe site n'inye ha ahuhu: ya mere, nānu ọku n'obi, chèghari kwa.


Agu agaghi-agu ha ọzọ, akpiri agaghi-akpọ kwa ha nku ọzọ; anyanwu agaghi-acha kwa ha ọzọ, ma-ọbu okpom-ọku ọ bula:


Samuel we gosi ya okwu ahu nile, ọ dighi kwa ihe o zonariri ya. O we si, Jehova ka ọ bu: Ya me ihe di nma n'anya-Ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan