Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jona 4:6 - Bible Nso

6 Jehova, bú Chineke, we guputa otù ogili-ub͕a, me ka o tolite n'elu Jona, ka o we buru ǹdò n'elu isi-ya, inaputa ya n'ọnọdu ọjọ ya. Jona we ṅuria ọṅu nke-uku n'ihi ogili-ub͕a ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ma Onyenwe anyị Chineke rọpụtara otu osisi nwere akwụkwọ sara mbara, nke tolitere nʼelu isi Jona, ka o ghọọrọ ya ndo ịnapụta ya nʼọnọdụ ahụ mgbakasị. Jona ṅụrịrị ọṅụ maka osisi ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jona 4:6
11 Iomraidhean Croise  

Heman we pua ubọchi ahu nāṅuri ọṅu, ọ di kwa ya nma n'obi: ma mb͕e Heman huru Mọdekai n'ọnu-uzọ-ama eze, na o bilighi, na ọ maghi kwa jijiji n'iru ya, Heman juputara n'ọnuma megide Mọdekai.


Dika orù si ekusie ume ike ibà n'okpuru ǹdò, Na dika onye egoro ọlu si ele anya ugwọ-olu-ya:


Ì gātukwasi anya-gi abua na ya? ọ dighi kwa: N'ihi na àkù nēmere onwe-ya nkù n'ezie, Dika ugo ka ọ nēfesi n'elu-igwe.


Hezekaia we ṅuria ọṅu bayere ha, me ka ha hu ulo nke ihe-ya di oké ọnu-ahia, bú ọla-ọcha-ya, na ọla-edo-ya, na uda-ya di iche iche, na ezi manu-ya, na ulo nile nke ihe-agha-ya nile, na ihe nile nke achọtara n'àkù-ya nile: ọ dighi ihe di n'ulo-ya, ma-ọbu n'ala nile ọ nāchi, nke Hezekaia nēmeghi ka ha hu.


unu ndi nāṅuri n'ihe nābughi ihe, ndi nāsi, Ọ̀ bughi ike nke aka ayi ka ayi jiworo natara onwe-ayi mpi di iche iche?


Jehova we guputa otù azù uku ilo Jona; Jona we nọ n'afọ azù ahu ubọchi atọ ehihie na abali.


Jona we pua n'obodo, nọdu ala n'akuku Iru-anyanwu nke obodo, mere onwe-ya otù ulo-ntu n'ebe ahu, nọdu ala n'okpuru ya na ǹdò-ya, rue mb͕e ọ gāhu ihe gēme n'obodo.


Chineke we guputa otù ikpuru mb͕e chi bọrọ n'echi-ya, o we ribie ogili-ub͕a ahu, o we kpọnwua.


Otú ọ di, unu aṅurila ọṅu na nka, na anēdo ndi ajọ mọ n'okpuru unu; ma ṅurianu ọṅu na edewo aha-unu n'akwukwọ n'elu-igwe.


ka ndi nākwa ákwá we di ka ha akwaghi; ka ndi nāṅuri ọṅu we di ka ha aṅurighi; ka ndi nāzu ahia we di ka ha enweghi ihe;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan