Ehab we ba n'ulo-ya n'obi arọ́ na nb͕aru-iru, n'ihi okwu nke Nebot, bú onye Jezreel, gwara ya: n'ihi na ọ siri, M'gaghi-enye gi ihe-nketa nnam-hà. O we dina n'ihe-ndina-ya, chigharia iru-ya, o righi kwa nri.
Jona we pua n'obodo, nọdu ala n'akuku Iru-anyanwu nke obodo, mere onwe-ya otù ulo-ntu n'ebe ahu, nọdu ala n'okpuru ya na ǹdò-ya, rue mb͕e ọ gāhu ihe gēme n'obodo.