Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jona 4:11 - Bible Nso

11 Mu onwem kwa, M'gaghi-emere Nineve ebere, bú obodo uku ahu; nke ihe kari orú nnù madu uzọ iri-na-ise nọ nime ya, bú ndi nāmaghi nke bu aka-nri-ha na aka-ekpe-ha; na ọtutu anumanu?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Mụ onwe m, m ga-aghara inwe obi ebere nʼahụ obodo ukwu a dịka Ninive, nke nwere ihe karịrị narị puku ndị mmadụ na iri puku mmadụ abụọ, bụ ndị na-amaghị nke bụ aka nri ha maọbụ aka ekpe ha, na nke ọtụtụ anụmanụ dịkwa nʼime ya?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jona 4:11
17 Iomraidhean Croise  

na n'ebe anu nile ọ bula nke nwere nkpuru-obi di ndu di nke dinyere unu, nime anu-ufe, na nime anu-ulo, na nime anu-ọhia nile ọ bula nke uwa nke dinyere unu; bú nke sitere n'ihe nile nēsi n'ub͕ọ ahu puta, bú anu-ọhia nile ọ bula nke uwa.


I bu Onye nēme ka ahihia puere anu-ulo Nēme kwa ka ihe akuru n'ala puere ọlu-ubi madu; Ime ka nri si n'ala puta:


Ezi omume-Gi di ka ugwu Chineke; Ikpé-Gi nile bu ob͕u-miri riri nne: Ọ bu madu na anumanu ka I nāzọputa, Jehova.


Biko bianu, ka ayi rurita uka, bú ihe Jehova nāsi: ọ buru na nmehie-unu adi ka uwe uhie, ọ bu dika snow ka ha gādi ọcha; ọ buru na ha acha uhie uhie dika ogho uhie, ọ bu dika aji ọcha ka ha gādi.


Senakerib, bú eze Asiria, we bulie ije, je, laghachi, biri na Nineve.


N'ihi na tutu nwa-okoro ahu amara iju ihe ọjọ na irọputa ezi ihe, agārapu ala ahu nke ike eze-ha abua gwuworo gi onwe-gi.


Bilie, jerue Nineve, bú obodo uku, ahu, kpọsa okwu megide ya; n'ihi na ihe ọjọ ha arigotawo n'irum.


Chineke we hu ọlu nile ha, na ha siri n'uzọ ọjọ ha chigharia; Chineke we chègharia uche bayere ihe ọjọ ahu, nke O kwuru, si na Ọ gēme ha; O meghi kwa ya.


Jehova we si, Gi onwe-gi mere ogili-ub͕a nka ebere, bú ihe nke i nādọb͕ughi onwe-gi n'ọlu n'ihi ya, nke i nēmeghi kwa ka ọ di uku; nke tolitere n'otù abali, la kwa n'iyì n'otù abali:


ọ̀ kwesighi kwa gi imere orù-ibe-gi ebere ọbuná dika mu onwem mere gi ebere?


Ma umu-ntakiri-unu, ndi unu siri na ha gāghọ ihe alutara n'agha, na umu-unu ndikom, ndi nāmaghi ezi ihe na ihe ọjọ ta, ndi ahu gābà n'ebe ahu, ha ka M'gēnye kwa ya, ha onwe-ha gēnweta kwa ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan