Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jona 3:4 - Bible Nso

4 Jona we malite ibà n'obodo ije nke otù ubọchi, o we kpọsa, si, Ọ fọduru ọgu ubọchi abua, ewe kwatue Nineve.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Jona malitere ịba nʼobodo ahụ, ma mgbe ọ gara ije otu ụbọchị, o kwusara sị, “Iri ụbọchị anọ ka ọ fọdụrụ tupu alaa Ninive nʼiyi.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jona 3:4
10 Iomraidhean Croise  

Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria inwu anwu. Aisaia, bú onye-amuma, bú nwa Emoz, we biakute ya, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nye ulo-gi iwu; n'ihi na gi onwe-gi nānwu anwu, i gaghi-adi kwa ndu.


M'gātukwasi kwa arọ iri na ise n'ubọchi-gi, naputa kwa gi na obodo a n'ọbu-aka eze Asiria, b͕ochi kwa obodo a n'ihi Onwem na n'ihi Devid, bú orùm.


Ọ bu kwa n'ihi nka ka Jehova gēchere, imere unu amara, ọ bu kwa n'ihi nka ka agēbuli Ya, inwe obi-ebere n'aru unu: n'ihi na Chineke nke ikpé ka Jehova bu; ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nile ndi nēchere Ya bu.


Ọ buru na unu ebiri n'ala nka, M'gēwu kwa unu dika ulo, ghara ikwada unu, M'gāku kwa unu dika osisi, ghara iropu unu: n'ihi na echeghariwom n'ihe ọjọ ahu nke M'meworo unu.


Chineke we hu ọlu nile ha, na ha siri n'uzọ ọjọ ha chigharia; Chineke we chègharia uche bayere ihe ọjọ ahu, nke O kwuru, si na Ọ gēme ha; O meghi kwa ya.


Ndikom Nineve gēso ọb͕ọ a bilie n'ikpé ahu, ha gāma kwa ya ikpé: n'ihi na ha chèghariri na nkwusa nke Jona; ma le, Onye ka Jona nọ n'ebe a.


N'ihi na dika Jona ghọrọ ndi Nineve ihe-iriba-ama, otú a ka Nwa nke madu gādi-kwa-ra ọb͕ọ a.


Ndikom Nineve gēso ọb͕ọ a bilie n'ikpé ahu, ha gāma kwa ya ikpé: n'ihi na ha chèghariri na nkwusa nke Jona; ma le, Onye ka Jona nọ n'ebe a.


Okwu nke onye-amuma nēkwu n'aha Jehova, ma okwu ahu emeghi, o reghi kwa; nke ahu bu okwu nke Jehova nēkwugh: na nganga ka onye-amuma ahu kwuworo ya, atula ujọ ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan