Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jona 3:3 - Bible Nso

3 Jona we bilie, jerue Nineve, dika okwu Jehova si di. Ma Nineve bu obodo di uku ri nne, ije nke ubọchi atọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Jona biliri gaa Ninive dịka okwu nke Onyenwe anyị si dị. Ninive bụ nnọọ obodo dị ukwuu, nke ga-ewe ụbọchị atọ ịga ya gburugburu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jona 3:3
9 Iomraidhean Croise  

Abraham we bilie n'isi-ututu, jikwa inyinya-ibu-ya, chiri madu abua nime umu-okorọbia-ya tiyere onwe-ya, na Aisak, bú nwa-ya nwoke; ọ kpọwa nkú nke àjà-nsure-ọku, bilie, je ebe ahu nke Chineke siri ya-ri je.


Rechel we si, Nb͕a Chineke ka mu na nwa-nnem nwayi b͕aworo, enwewokwam ike: o we kpọ aha-ya Naftali.


Ezi omume-Gi di ka ugwu Chineke; Ikpé-Gi nile bu ob͕u-miri riri nne: Ọ bu madu na anumanu ka I nāzọputa, Jehova.


Ejiri ǹdò-ya kpuchie ugwu nile, Ngalaba-ya di kwa ka osisi cedar nke Chineke.


Senakerib, bú eze Asiria, we bulie ije, je, laghachi, biri na Nineve.


Bilie, jerue Nineve, bú obodo uku, ahu, kpọsa okwu megide ya; n'ihi na ihe ọjọ ha arigotawo n'irum.


Mu onwem kwa, M'gaghi-emere Nineve ebere, bú obodo uku ahu; nke ihe kari orú nnù madu uzọ iri-na-ise nọ nime ya, bú ndi nāmaghi nke bu aka-nri-ha na aka-ekpe-ha; na ọtutu anumanu?


Nání Luk nọyerem. Kuru Mak, duru ya ka o so gi onwe-gi bia: n'ihi na ọ bu onye baram n'ihe ijerem ozi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan