Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jona 1:4 - Bible Nso

4 Ma Jehova tubàra ifufe di uku n'oké osimiri, oke ifufe di uku we di n'oké osimiri, ewe chè na ub͕ọ gētiwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ma Onyenwe anyị mere ka ifufe dị egwu malite ife nʼelu osimiri ahụ, ebili mmiri bidokwara na-amagharị, chọọ itiwasị ụgbọ mmiri ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jona 1:4
13 Iomraidhean Croise  

Ihe nile nke tọrọ Jehova utọ, nke ahu ka O meworo, N'elu-igwe, na n'uwa, na n'oké osimiri nile, na ob͕u-miri nile.


Ọ bu Onye nēme ka alulu si na nsọtu uwa kwugo; O meworo miri-ozuzo àmùmà; Ọ bu Onye nēme ka ifufe si n'ulo-nkwakọba-Ya nile puta.


Ọku, na ákú-miri-ígwé, na snow, na alulu: Oké ifufe, nke nēme okwu-Ya:


Moses we setipu nkpa-n'aka-ya n'elu ala Ijipt, Jehova we dubata ifufe Iru-anyanwu n'ala ahu ehihie ahu nile na abali ahu nile: mb͕e o ruru ututu ifufe Iru-anyanwu ahu butere igurube.


Jehova we me ifufe Ọdida-anyanwu di ike nke-uku ka o chigharia, nke buru igurube, fere ha ga n'Oké Osimiri Uhie; ọ dighi otù igurube fọduru n'ókè-ala ọ bula nke Ijipt.


Moses we setipu aka-ya n'elu oké osimiri; Jehova we were ifufe Iru-anyanwu di ike me ka oké osimiri ahu je n'azu n'abali ahu nile, Ọ we me oké osimiri ahu ka ọ buru ala-akọrọ, ewe kewa miri ahu.


I were ifufe-Gi fe, oké osimiri kpuchiri ha: Ha mikpuru dika opù nime miri di ebube.


mb͕e Ọ nēme ka olu-Ya da, ùzù miri di n'elu-igwe, O we me ka alulu si na nsọtu uwa kwugo; O meworo miri-ozuzo àmùmà, Ọ nēme kwa ka ifufe si n'olu-nkwakọba-Ya nile puta.


N'ihi na, le, Onye nākpu ugwu nile, Nke nēkè kwa ifufe, Nke nēgosi kwa madu ihe bu ntughari-uche-ya, Onye nēme chi-ọbubọ ka ọ b͕a oké ọchichiri, Nke nāzọkwasi kwa ebe nile di elu nke uwa; Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bu aha-Ya.


Otù ifufe we si n'ebe Jehova nọ bulie ije, we keputa nnunu quail n'oké osimiri, rapu ha n'akuku ọmuma-ulo-ikwū, dika ije otù ubọchi n'otù akuku, na dika ije otù ubọchi n'akuku. nke-ọzọ, buruburu ọmuma-ulo-ikwū, na dika cubit abua n'elu iru ala.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan