1 Okwu Jehova we rue Jona nwa Amitai nti, si,
1 Okwu Onyenwe anyị bịakwutere Jona nwa Amitai, na-asị,
Onye ahu weghachiri ókè-ala Israel site na nbata Hemat rue oké osimiri Araba, dika okwu Jehova, bú Chineke Israel, si di, nke O kwuru site n'aka Jona nwa Amitai, bú onye-amuma, nke sitere na Gat-hefa.
Ọdum ab͕ọwo uja, ọ̀ bu onye nāgaghi-atu egwu? Onye-nwe-ayi Jehova ekwuwo, ọ̀ bu onye nāgaghi-ebu amuma?
Okwu Jehova we rue Jona nti nke ub͕ò abua, si,
Ajọ ọb͕ọ nke nākwa kwa iko nāchọ ihe-iriba-ama; ma agaghi-enye ya ihe-iriba-ama, ma-ọbughi ihe-iriba-ama nke Jona. O we rapu ha, pua.
Ndikom Nineve gēso ọb͕ọ a bilie n'ikpé ahu, ha gāma kwa ya ikpé: n'ihi na ha chèghariri na nkwusa nke Jona; ma le, Onye ka Jona nọ n'ebe a.