Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 9:32 - Bible Nso

32 N'ihi na Ọ bughi madu, otú m'bu, na m'gāza Ya, Na ayi gābiakota n'ikpé.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

32 “Ọ bụghị mmadụ efu dịka m nke m ga-aza ya, ka anyị abụọ kpọrịtaa onwe anyị ikpe nʼụlọikpe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 9:32
17 Iomraidhean Croise  

Le, ọ bu na nka ka i nābughi onye ezi omume; m'gāza gi: N'ihi na Chineke di uku kari madu.


Le, oké ujọm agaghi-eme ka i tua egwu nke-uku, Nbigide-akam agaghi-adi kwa arọ́ n'aru-gi.


Mù onwem gēsi kwa aṅa za Ya, Rọputa kwa okwum nile m'gāgwa Ya?


Ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ike nke onye nwe ume, le, Ọ nọ ya! Ma ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ikpé, ònye gākaram mb͕e?


Ọ buru na ọ tọ ya utọ iso Ya je n'ikpé, Ọ gaghi-aza Ya otù okwu nime nnù okwu abua na ọgu iri.


Mb͕e ahu I gābiayem n'olùlù, Uwem gākpọkwam ihe-árú.


Eji-kwa-la orù-Gi ba n'ikpé; N'ihi na ọ dighi onye ọ bula nke di ndu bu onye ezi omume n'iru Gi.


Ihe nke diworo, ọ bu na mb͕e di anya gara aga ka akpọrọ aha-ya, amawo kwa na nke ahu bu madu: ọ pughi kwa iluso onye ka ya ike ọ̀gù.


Ahuhu gādiri onye nāluso Onye kpuworo ya ọ̀gù! otù ejùjù nile nke ala! Urọ, ọ̀ gāsi onye nākpu ya, Gini ka i nālu? ma-ọbu ọlu-gi, ọ̀ gasi, Ọ dighi aka abua o nwere?


Le, dika ọdum ka ọ nārigo, bú nke si na nbili-elu nke Jọdan arigo, rue ebeita-nri nādigide mb͕e nile: ma n'otù ntabi-anya ka M'gēme ka o si n'aru-ya b͕a ọsọ; ma ònye bu onye arọputara arọputa? onye-nlekọta-ya ka M'gēme ya: n'ihi na ònye di kam? ọ̀ bu kwa onye gākaram mb͕e? ma-ọbu ònye bu kwa onye-ọzùzù-aturu a nke gēguzo n'irum?


Chineke abughi madu, nke O gēkwu okwu-ugha; Ọ bughi kwa nwa madu, nke Ọ gēlogha: Ọ̀ bu na Ya onwe-ya asiwo na Ọ gēme ihe, ma O meghi ya? Ma-ọbu Ò kwuwo okwu, ma O meghi ya ka o guzosie ike?


Ajuju kwesikariri iju, gi madu, bu, Gì onwe-gi bu onye, nke nāza Chineke okwu imegide Ya? Ọ̀ gābu na ihe akpuworo gāsi onye kpuru ya, Gini mere i kpurum otú a?


n'ihe ọ bula nke obi-ayi nāma ayi ikpé nime ya; n'ihi na Chineke ka obi-ayi uku, Ọ ma-kwa-ra ihe nile.


Ma Jehova siri Samuel, Elegidela iru-ya anya, elegide-kwa-la ogologo nke idi-elu-ya; n'ihi na ajuwom ya: n'ihi na Jehova adighi-ahu dika madu si ahu; n'ihi na madu nēle ihe anya nāhu, ma Jehova nēle obi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan