30 Ọ buru na ewerem miri snow sa arum, Were kwa nchà me ka ọbu-akam abua di ọcha;
30 A sịkwarị na m jiri ncha saa ahụ m werekwa soda saa aka m abụọ,
Ọ buru na nzọ-ukwum esi n'uzọ wezuga onwe-ya, Ọ buru kwa na obim ejesowo anyam abua n'azu, Ọ buru kwa na ọlu ọ bula araparawo n'ọbu-akam abua:
Na i nāsi, Gini ka ọ bara Gi? Ùrù gini ka ọ baram kari nmehiem?
Mb͕e ahu I gābiayem n'olùlù, Uwem gākpọkwam ihe-árú.
Agamakwo ọbu-akam abua na-emeghi-ihe-ọjọ; We b͕a ebe-ichu-àjà-Gi buruburu otú a, Jehova:
Zopu iru-Gi na nmehiem nile, Hichapu kwa ajọ omumem nile.
Onye nēkpuchi njehie-ya nile, ọ gaghi-agara ya: Ma onye nēkwuputa ha, nke nārapu kwa ha, agēnwe obi-ebere n'aru ya.
N'ihi na ọ buru na i ji akanwu sa aru, i were kwa n'onwe-gi ọtutu nchà, ma akaworo ajọ omume-gi n'irum, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
Sapu obi-gi n'ihe ọjọ, gi Jerusalem, ka ewe zọputa gi. Rùe ole mb͕e ka i gēme ka ajọ èchìchè-gi nile nọ ọnọdu-abali n'etiti gi?
N'ihi na, ebe ha nāmaghi ezi omume Chineke, nāchọ kwa uzọ ime ka ezi omume nke aka ha guzo, ha edoghi onwe-ha n'okpuru ezi omume Chineke.
Ọ buru na ayi asi na ayi enweghi nmehie, ayi nēduhie onwe-ayi, ezi-okwu ahu adighi kwa nime ayi.