29 Agama mu onwem ikpe; N'ìhi gini kwa ka m'dọb͕uru onwem n'ọlu n'efu?
29 Ebe m bụrịị onye ikpe mara, nʼihi gịnị ka m ji na-adọgbu onwe m nʼefu?
M'gāsi Chineke, Amalam ikpe; Me ka m'mara ihe kpatara I ji som se okwu.
Ọ bu ezie na I mara na adighm-emebi iwu; Ọ dighi kwa onye ọ bula nānaputa n'aka-Gi.
Le, amawom èchìchè-unu, Na nzube nile unu ji megidem ihe-ike.
Le, ihe iji jum aju ka Ọ nāchọputa, Ọ nāgum n'onye-iro n'ebe Ọ nọ;
Ọ buru na abum onye ezi omume, ọnum gāmam ikpe: Onye zuru okè ka m'bu, o we si na abum onye b͕agọrọ ab͕agọ.
Otù ihe aju ka ọ bu; n'ihi ya ka m'siri, Onye zuru okè na onye nēmebi iwu ka Ya onwe-ya nēme ka ha gwusia.
Jehova agaghi-arapu ya n'aka-ya, Ọ gaghi-ama kwa ya ikpe mb͕e anēkpe ya ikpe.
Ọ bu nání n'efu ka m'meworo ka obim di ọcha, N'efu ka m'kwọworo ọbu-akam abua n'emeghi-ihe-ọjọ;
Ma i siri, Emeghm ihe ọjọ; n'ezie iwe-Ya esiwo n'arum laghachi. Le, Mu na i ganēje n'ikpé, n'ihi na i siri, Emehieghm.