Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 9:28 - Bible Nso

28 Anamatu ujọ ihe-nb͕um nile, Amawom na I gaghi-agum n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Nsogbu m niile ka na-atụ m egwu nʼihi na amara m na ị gaghị ewere m dịka onye aka ya dị ọcha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 9:28
13 Iomraidhean Croise  

Ọ buru na emehiewom, I nēlezikwam anya, I gaghi-agupukwam n'ajọ omumem.


N'ihi na ubu a I nāgu nzọ-ukwum ọnu: Ì dighi-elezi nmehiem anya?


Ọ buru na ekwuem, adighi-eb͕ochi ihe-nb͕um: Ma ọ buru na arapum, gini gēsi n'arum la?


Ọ buru kwa na echetam, anam-ama jijiji, Ima-jijiji ejidewo kwa anu-arum.


N'ihi na oké egwu ka m'turu, o we biakwasim, Ihe nke m'turu ujọ biakute-kwa-ram.


Le, ihe iji jum aju ka Ọ nāchọputa, Ọ nāgum n'onye-iro n'ebe Ọ nọ;


Ma gini mere I nādighi-ebupu njehiem, me ka ajọ omume gabiga? N'ihi na ub͕u a m'gēdina n'ájá: I gāchọsikwam ike, ma m'gaghi-anọ.


N'ezie amawom na ọ di otú a: Ma madu, ò gēsi aṅa buru onye ezi omume n'iru Chineke?


Aji anu-arum guzoro ọtọ site n'oké egwu-Gi; Ọ bu kwa ikpé-Gi nile ka m'nātu egwu ha.


Ọ buru na I riba ajọ omume nile ama, Ja, Onye-nwe-ayi, ònye gēguzo?


Gi eburula aha Jehova, bú Chineke-gi, ime ihe efu; n'ihi na Jehova agaghi-agu onye nēburu aha-Ya ime ihe efu n'onye ikpé nāmaghi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan