Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 9:25 - Bible Nso

25 Ma ubọchim nile di garagara kari ọb͕a-ọsọ: Ha ab͕alagawo, ha ahughi ezi ihe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 “Ụbọchị ndụ m dị gara gara karịa onye ọgba ọsọ; ha na-agafekwa na-ahụtụghị ọṅụ anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 9:25
10 Iomraidhean Croise  

Ndi-ọb͕a-ọsọ we were akwukwọ-ozi sitere n'aka eze na ndi-isi-ya jeghari n'Israel na Juda nile, na dika ihe eze nyere n'iwu si di, si, Umu Israel, laghachikutenu Jehova, bú Chineke Abraham na Aisak na Israel, ka O we laghachikuru ndi b͕apuru ab͕apu ndi fọduru unu site n'aka ndi-eze Asiria.


Ndi-ọb͕a-ọsọ ndi inyinya ukwu ọsọ na inyinya mule nēbu puru, ebe ewere okwu eze kwalie ha, me ka ha me ngwa; enye-kwa-ra iwu ahu nime Shushan, bú ulo uku eze.


Madu nke nwayi muru, Ubọchi-ndu-ya di nkpunkpu, afọ ejuwo kwa ya n'ahuhu.


I ji iba-nba nile dọ madu aka na nti n'ihi ajọ omume, I we me ima-nma-ya anāchọsi ike ka ọ b͕aze dika nla: N'ezie nání otù nku-ume ka madu ọ bula bu. Selah


Le, I mewo ubọchim nile dika ntu-ọbu-aka; Mb͕e ndum di kwa ka ihe nābughi ihe n'iru Gi: N'ezie nání otù nku-ume ka madu ọ bula bu, n'iguzosi-ike-ya. Selah


Ọtutu madu nāsi, Ònye gēme ka ayi hu ọdi-nma? Jehova, bulie ìhè iru-Gi ka ọ mukwasi ayi.


Cheta otú mb͕e ndu mu onwem di nkpunkpu: Ọ̀ bu ihe-efu gini ka I kèworo umu madu nile nye?


ma unu bu ndi nāmataghi ihe gēme echi. Ǹdu-unu bu gini? N'ihi na unu bu alulu, nke nāputa ìhè nwa oge, emesia ọ we pua n'anya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan