Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 9:15 - Bible Nso

15 Onye, ọ buru na abum onye ezi omume, m'gaghi-aza Ya; Kama m'gāriọ onye nēkpem ikpe aririọ-amara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Nʼagbanyeghị na aka m dị ọcha, apụghị m ịsa ya okwu; kama m ga-arịọ onye ikpe m ka o mere m ebere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 9:15
18 Iomraidhean Croise  

O we kpere Ya; O we kwe ka ọ riọta ihe ọ riọrọ, we nuru aririọ-amara-ya, me ka ọ lata na Jerusalem ba n'ala-eze-ya. Manase we mara na Jehova, Ya onwe-ya, bu Chineke.


Ọ buru na emebiwom iwu, ahuhu dirim; Ọ buru kwa na abum onye ezi omume, m'gaghi-eweli isim elu; Ebe nlelìm juworom afọ, Ya na ilekwasi nwedam anya.


M'gāsi Chineke, Amalam ikpe; Me ka m'mara ihe kpatara I ji som se okwu.


I gāriọ Ya aririọ, Ọ gānu kwa gi; I gākwughachi kwa nkwa-gi nile.


N'ebe ahu ka onye ziri ezi nēso Ya ru uka; Ewe me ka m'b͕apu n'aka Onye-ikpem rue mb͕e ebighi-ebi.


Otù ub͕ò ka m'kwuworo okwu, m'gaghi-aza kwa; E, ub͕ò abua, ma m'gaghi-aza kwa ọzọ.


Ma mu onwem, m'gāchọ Chineke, Chineke ka m'gēbo kwa okwum:


Ọ buru na gi onwe-gi achọsie Chineke ike, We riọ Onye Nke puru ime ihe nile aririọ-amara;


Ọ buru na m'kpọwo òkù, O we zam; M'gaghi-ekwe kwa na Ọ ṅara nti n'olum;


Ọ buru na abum onye ezi omume, ọnum gāmam ikpe: Onye zuru okè ka m'bu, o we si na abum onye b͕agọrọ ab͕agọ.


Onye zuru okè ka m'bu; adighm-amara nkpuru-obim; Ajum ndum.


N'ikwa-ákwá ka ha gābia, ọ bu kwa n'aririọ-amara nile ka M'gēduru ha: M'gēme ka ha jerue iyi di iche iche juputara na miri, n'uzọ ziri ezi, nke ha nāgaghi-asu ngọngọ nime ya: n'ihi na aghọworom Israel nna, ma Efraim, ọkparam ka ọ bu.


Chinekem, tọ nti-Gi n'ala, nu; saghe anya-Gi abua, hu ebe nile ayi nke tọb͕ọrọ n'efu, na obodo ahu nke akpọkwasiworo ya aha-Gi: n'ihi na ọ bughi n'ihi ezi omume nile ayi ka ayi onwe-ayi nēme ka aririọ-amara nile ayi da n'iru Gi, kama n'ihi ọtutu obi-ebere-Gi.


M'we che Onye-nwe-ayi Chineke irum, ichọ Ya n'ekpere na aririọ-amara di iche iche, n'obubu-ọnu na ákwà-nkpe na ntu.


N'ihi na ọ dighi ihe ọ bula m'mara megide onwem; ma ọ bughi na nka ka aguworom n'onye ezi omume: kama Onye nēkpem ikpé bu Onye-nwe-ayi.


Onye, mb͕e anēkwuto Ya, Ọ dighi-ekwutọghachi ọzọ; mb͕e Ọ nāhu ahuhu, Ọ dighi-aba nba; kama Ọ rara Onwe-ya nye n'aka Onye ahu Nke nēkpe ikpé ziri ezi:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan