Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 8:8 - Bible Nso

8 N'ihi na, biko, jua ọb͕o mbu, Dozie onwe-gi imata ihe ndi bu nna-ha gwuputara:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 “Jụọ ọgbọ ndị gara aga ma chọpụta ihe ndị bụ nna ha chọpụtara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 8:8
15 Iomraidhean Croise  

Eze, bú Rehoboam, we me ka ndi-okenye dua ya ọdu, bú ndi nēguzo n'iru Solomon nna-ya mb͕e ọ nọ na ndu, si, Ùnu onwe-unu si aṅa nādu ọdu iweghachiri ndi nka okwu?


Nime ndi kara nká ka amam-ihe di, N'ubọchi ndu di ogologo ka nghọta di kwa.


Le, ihe a nile ka anyam huworo, Ntim anuwo, ghọta kwa ya.


Ma onye-isi-awọ ma onye kara nká nọ n'etiti ayi, Ndi ubọchi ndu-ha ka nke nna-gi nke-uku.


(Nke ndi mara ihe nēgosi Site na ndi bu nna-ha, ha ezoghi kwa ya;


Ì mawo nka site na mb͕e ochie, Site na mb͕e edoro madu n'elu uwa,


Chineke, ayi ewerewo nti-ayi nu, nna-ayi-hà akọworo ayi, Ọlu I luru n'ubọchi-ha, n'ubọchi mb͕e ochie.


Onye di ndu, onye di ndu, onye ahu gēkele Gi, dika m'si eme ta: Nna gēme ka umu mara ezi-okwu-Gi.


Nurunu nka, unu ndi-okenye, ṅa-kwa-nu nti, unu ndi nile bi n'ala nka. Nka, ọ̀ diwo n'ubọchi-unu? mà-ọbu n'ubọchi nna-unu-hà?


N'ihi na ka ha ra, bú ihe edere n'akwukwọ nsọ n'oge gara aga, edere ha izí ayi ihe, ka ayi we were ntachi-obi na nkasi-obi nke ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ nwe olile-anya.


Ma ihe ndia nēmeri ndi ahu n'uzọ ihe-atù; ewe de ha n'akwukwọ nsọ ka ha we buru ihe idu ayi ọdú, ndi ọgwugwu oge ndia ruteworo.


Cheta ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, Ghọta arọ nke ọtutu ọb͕ọ: Jua nna-gi, ọ gēgosi kwa gi; Jua ndi-okenye-gi, ha gāgwa kwa gi.


N'ihi na biko, jua ajuju bayere ubọchi nile gara aga, nke buru gi uzọ, site n'ubọchi mb͕e Chineke kere madu n'elu uwa, site kwa n'otù nsọtu elu-igwe we rue nsọtu elu-igwe ọzọ, ma ihe dika ihe uku a adiwo, ma-ọbu na anuwo ihe di ka ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan