5 Ọ buru na gi onwe-gi achọsie Chineke ike, We riọ Onye Nke puru ime ihe nile aririọ-amara;
5 Ma ọ bụrụ na i ga-achọsi Chineke ike, rịọ Onye pụrụ ime ihe niile,
Ọ buru na gi onwe-gi edozie obi-gi, We b͕asa ọbu-aka-gi abua n'ebe Ọ nọ;
Le, onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu, onye Chineke nābara nba: Aju-kwa-la idọ-aka-na-nti nke Onye puru ime ihe nile.
Ma mu onwem, m'gāchọ Chineke, Chineke ka m'gēbo kwa okwum:
Onye, ọ buru na abum onye ezi omume, m'gaghi-aza Ya; Kama m'gāriọ onye nēkpem ikpe aririọ-amara.