Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 8:21 - Bible Nso

21 Rue mb͕e Ọ gēwere ichì-ọchì mejue ọnu-gi, Were kwa iti-nkpu mejue eb͕ub͕ere-ọnu-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Ọ ga-eme ka ọnụ gị jupụta nʼọchị. Ọ ga-eme ka mkpu ọṅụ si nʼegbugbere ọnụ gị pụta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 8:21
13 Iomraidhean Croise  

Sera we si, Ichì-ọchì ka Chineke doziworom; onye ọ bula nke nānu ya gāchì ọchì bayerem.


Ha we chua àjà uku n'ubọchi ahu, we ṅuria; n'ihi na Chineke mere ka ha ṅuria ọṅu uku; ọzọ kwa, ndinyom-ha na umu-ntakiri-ha ṅuriri: ewe nu ọṅù Jerusalem rue ebe di anya.


Ma ọ dighi onye siri, Òle ebe Chineke nọ, bú Onye merem, Onye nēnye abù ọma n'abali;


I gāchì ihe-ike, chì kwa agu, ọchì; I gaghi-atu kwa egwu anu-ọhia nke uwa.


Tikusienu Johova nkpu ọṅù ike, uwa nile.


Mb͕e Jehova mere ka ndi nālata na Zaion lata, Ayi di ka ndi nārọ nrọ.


Mb͕e ahu ọchì nēju ayi ọnu, Iti-nkpu-ọṅù nēju kwa ayi ire: Mb͕e ahu ha nāsi n'etiti mba nile, Jehova emeworo ndia ihe uku.


Onye nēbu nju-aka nkpuru-ọghigha, ọ bu ezie na ọ nēje ije nākwa ákwá; Ma ọ ghaghi iwere iti-nkpu-ọṅù biaghachi, nēbu ùkwù-ọka-ya nile.


Ṅurianu ọṅu na Jehova, teghari-kwa-nu egwú ọṅù, unu ndi ezi omume: Ti-kwa-nu nkpu ọṅù, unu nile ndi ziri ezi n'obi.


Tikusienu Jehova nkpu ọṅù ike, uwa nile: Tiwanu nkpu, tienu nkpu ọṅù, bùanu abù ọma.


Ngọzi nādiri unu ndi agu nāgu ub͕u a: n'ihi na afọ gēju unu. Ngọzi nādiri unu ndi nākwa ákwá ub͕u a: n'ihi na unu gāchì ọchì.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan