18 Ọ buru na esi n'ebe-ya loda ya, Ọ gāgọnari kwa ya, si, Ahughm i.
18 Ma mgbe e si nʼọnọdụ ya hopu ya, ebe ahụ na-agọnarịkwa ya, na-asị, ‘Ahụtụbeghị m gị.’
Dika ǹsí-ya ka ọ gāla n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi: Ndi huworo ya gāsi, Òle ebe ọ nọ?
Anya ahuwo ya, ma ọ gaghi-ahu kwa ya ọzọ; Ọnọdu-ya agaghi-ekiri kwa ya ọzọ.
Ọ gaghi-alata n'ulo-ya ọzọ, Ebe-ya agaghi-amata kwa ya ọzọ.
Anya onye nāhum agaghi-ekirim: Anya-Gi gādi n'arum, ma m'gaghi-adi.
Nkpọrọgwu-ya nēkekọta onwe-ha n'aru obo nkume, Ọ nāhu ebe nkume anya.
N'ihi na ifufe agabigawo ya n'isi, o we ghara idi; Ọnọdu-ya agaghi-ama kwa ya ọzọ.
Ma ọ fọduru nwa mb͕e, onye nēmebi iwu agaghi-adi kwa: I gēlekwasi kwa ọnọdu-ya anya, ma ọ gaghi-anọ.
O we gabiga, ma, le, ọ nọgh: M'we chọ ya, ma achọtaghi ya.
Mb͕e ndi nēmebi iwu nāma akwukwọ dika ihe-ọkukú, Mb͕e ndi nile nke nalu ajọ ihe nāwa kwa okoko-osisi; Ọ bu ka ewe kpochapu ha rue mb͕e nile ebighi-ebi: