Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 8:13 - Bible Nso

13 Otú a ka okporo-uzọ ndi nile nēchezọ Chineke si di; Olile-anya nke onye emeruru emeru gāla n'iyì:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Nke a bụ oke ndị na-echefu Chineke, otu a kwa ka olileanya nke onye na-amaghị Chineke si ala nʼiyi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 8:13
25 Iomraidhean Croise  

Ma anya ndi nēmebi iwu gādala n'isi, Ebe-nb͕alaga alanariowo kwa ha n'iyì, Nkubì-ume bu kwa olile-anya-ha.


Ọzọ, Ya onwe-ya gāburum nzọputa; N'ihi na onye emeruru emeru agaghi-abia n'iru Ya.


N'ihi na nzukọ nke onye emeruru emeru gābu ndi nāpughi imu nwa, Ọku gēripia ulo-ikwū nile nke ndi-ngo.


Agādọpusi ya ike n'ulo-ikwū-ya, bú ihe-ntukwasi-obi-ya; Agēme ka ọ zọrọ ukwu gakuru eze nke ihe-egwu nile.


Na iti-nkpu-ọǹù nke ndi nēmebi iwu di nkpunkpu, Na ọṅù nke onye emeruru emeru nādi kwa rue mb͕e ntabi-anya?


Ma ndi emeruru obi-ha emeru nēdo iwe n'obi: Ha adighi-etiku Chineke mb͕e O keworo ha ab͕u.


Mb͕e ọ nọ n'ima akwukwọ ndu, mb͕e akēbighi ya, Ọ nēbu ahihia ọ bula uzọ akpọnwu.


Ọ bughi otú a ka ndi nēmebi iwu di; Kama ha di ka ib͕ob͕o-ọka nke ifufe nēfesa.


Onye nēmebi iwu, ka imi-ya si di elu, nāsi, Ọ dighi ajuju Ọ gāju. Nzube-ya nile nāsi, ọ dighi Chineke ọ bula di.


Onye nēmebi iwu gāhu ya, ewe kpasue ya iwe; Ọ gāta ikekere-ezé, b͕aze kwa: Ọchichọ ndi nēmebi iwu nāchọsi ike gāla n'iyì.


Biko, ghọtanu nka, unu ndi nēchezọ Chineke, Ka m'we ghara idọka unu, ọ dighi kwa onye-nnaputa diri unu:


Ndi nēmebi iwu gālaghachi n'ala mọ, Bú mba nile ndi nēchezo Chineke.


Nchere ndi ezi omume gābu ọṅù: Ma olile-anya ndi nēmebi iwu gāla n'iyì.


Mb͕e madu nke nēmebi iwu nwuru, olile-anya-ya gāla n'iyì: Ọzọ, nchere nke ajọ ihe nile alawo n'iyì.


Asi na ekpùe ndi nēmebi iwu iru, ha anọghi kwa: Ma ulo ndi ezi omume gēguzo.


Ndi-nmehie nātu oké egwu nime Zaion; ọma-jijiji ejidewo ndi emeruru emeru. Ònye n'etiti ayi gānọ dika ọbìa n'ebe ọku nērichapu erichapu di? ònye n'etiti ayi gānọ dika ọbìa n'ebe ọku nēre ere ebighi-ebi di?


i we chezọ Jehova Onye meworo gi, Onye nēseti elu-igwe, tọ kwa ntọ-ala uwa: i we tua oké egwu mb͕e nile ogologo ubọchi nile n'ihi ọnuma nke onye-nkpab͕u, mb͕e o doziri àkú ibibi? ma òle ebe ọnuma nke onye-nkpab͕u ahu di?


M'we si, Ikem alawo n'iyì, ya na ncherem nke sitere na Jehova.


ọ gēb͕ubi kwa ya nkpirikpi abua, kè òkè nye ya n'etiti ndi-iru-abua: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.


gi lezie onwe-gi anya, ka i ghara ichezọ Jehova, Onye mere ka i si n'ala Ijipt, si kwa n'ulo ndi-orù, puta.


Lezie onwe-gi anya ka i ghara ichezọ Jehova, bú Chineke-gi, n'edebeghi ihe nile O nyere n'iwu, na ikpé-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta:


na obi-gi gādi elu, i we chezọ Jehova, bú Chineke-gi, Onye nēme ka i si n'ala Ijipt, si kwa n'ulo ndi-orù, puta;


Ọ gēru kwa, ọ buru na i chezọ Jehova, bú Chineke-gi, we nējeso chi ọzọ, fè ha òfùfè, kpọ kwa isi ala nye ha, ab͕awom àmà megide unu ta na unu aghaghi ila n'iyì.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan