Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 7:9 - Bible Nso

9 Dika igwe-oji si agwusi, we la, Otú a onye nārida n'ala agaghi-arigota.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Dịka igwe ojii si efefusi ma na-agbasa, otu a ka ọ dịrị onye na-arịda nʼime ili ọ naghị arịpụtakwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 7:9
14 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a ọ nwuwo, n'ìhi gini kwa ka mu onwem gēbu ọnu? àpurum iweghachi ya ọzọ? Mu onwem nālakuru ya, ma ya onwe-ya agaghi-alaghachikutem.


N'ihi na ayi aghaghi inwu, ayi di kwa ka miri nke anāwusi n'ala, nke anāgaghi-achikọta; ma Chineke ewepughi ndu, kama Ọ nēchè èchìchè, ka onye achupuru achupu we ghara ibu onye achupuru n'ebe Ọ nọ.


Tutu alam, ghara kwa ilaghachi, Rue ala ọchichiri, na onyinyo ọnwu;


Ọ ra ka ebe di elu nile nke elu-igwe; gini ka i gēme? Ọ di omimi kari ala-mọ; gini ka i gāmara?


N'ihi na arọ ole-na-ole gābia, M'we je n'uzọ m'gaghi-alaghachi.


Ọ buru na elem anya ala-mọ na ọ gābu ụlọm; Ọ buru na ab͕asawom utem n'ọchichiri;


Rue ihe di n'ala-mọ ka ha gārida, Ọ buru na izu-ike adirim otù mbe ahu n'ájá.


N'ihi na ub͕u a ka m'gēdinawori di jū M'gāraruwori ura; mb͕e ahu ka izu-ike gādirim:


Ihe-egwu echighariwo imegidem, Ha nāchu ọkakam dika ifufe; Dika igwe-oji ka nzọputam gabigawo-kwa-ra.


Ọzọ, O nēji miri-ozuzo bob͕u oké igwe-oji; Ọ nāb͕asa igwe-oji nke ìhè-Ya:


Lepum anya, ka m'we b͕asa irum, Tutu mu ala, ghara inọ kwa ọzọ n'uwa.


Ndi nwuru anwu adighi-adi ndu; ndi nādighi ndu adighi-ebili: n'ihi nka ka I letaworo ha we kpochapu ha, me ka ncheta nile nke diri ha la n'iyì.


Asirim, M'gaghi-ahu Ja, ọbuná Ja n'ala ndi di ndu: M'gaghi-elegide kwa madu anya ọzọ n'etiti ndi bi n'ala ọgwugwu-ndu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan