Site n'ọbu-ukwu we rue isi ọ dighi izu-okè di nime ya; kama ob͕ub͕u-mma, na itiru-aru, na ọnyá etiputara ọhu: apikọtaghi ha, ekechighi kwa ha, ejighi kwa manu me ka ha di nrò.
Ha gāpu kwa, lekwasi ozu nile nke ndi nējehie ejehie megidem: n'ihi na ikpuru-ha agaghi-anwu, ọku-ha agaghi-anyu kwa; ha gābu-kwa-ra anu-aru nile ihe isọ oyi.
Unu gēcheta kwa n'ebe ahu uzọ nile unu, na omume nile unu, nke unu meruru onwe-unu nime ha; unu gāsọ kwa onwe-unu oyi n'iru unu n'ihi ihe ọjọ nile unu nke unu meworo.