Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 7:16 - Bible Nso

16 Ajuwom ndu; m'gaghi-adi ndu rue mb͕e ebighi-ebi: Rapum; n'ihi na otù nku-ume ka ubọchim nile bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Ana m asọ ndụ m oyi; agaghị m adị ndụ ruo ebighị ebi. Nʼihi ya, hapụ m ka m nọọrọ onwe m, nʼihi na ụbọchị ndụ m enweghị isi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 7:16
22 Iomraidhean Croise  

Rebeka we si Aisak, Ike ndum agwusiwom site n'iru umu-ndinyom Het: ọ buru na Jekob luru nwunye sitere n'umu-ndinyom Het, dika ndia, bú site n'umu-ndinyom ala nka, ùrù gini ka ndu baram?


Ma ya onwe-ya jere ije otù ubọchi n'ọzara, bia nọdu n'okpuru otù osisi broom: ọ riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, O zuwo; ub͕u a, Jehova, wepu ndum; n'ihi na mu onwem adighi nma kari nnam-hà.


Ike ndum agwuwo nkpuru-obim; Ka m'rapuru onwem ntamum; Ka m'kwue okwu n'idi-ilu nke nkpuru-obim.


Ùbọchim adighi ole-na-ole? rapu kwa, Dopu Onwe-gi n'ebe m'nọ, ka m'we b͕asa irum nwantī,


Lepu ya anya, ka o we kwusi, Rue mb͕e ubochi-ya gātọ ya utọ, dika onye egoro ọlu.


Ọbuná ka Chineke kwe izọpiam; Ka Ọ tọpu aka-Ya, bipum.


Nkpuru-obim we rọputa ntọb͕u, Na ọnwu kari ọkpukpum ndia.


Cheta na ndum bu ifufe: Anyam agaghi-alaghachi ihu ezi ihe.


Onye zuru okè ka m'bu; adighm-amara nkpuru-obim; Ajum ndum.


Madu yiri otù nku-ume Ubọchi-ya nile di ka onyinyo nāgabiga.


Si n'arum wezuga ihe-otiti-Gi: Emewo ka mu onwem gwusia site n'ilu-ọ̀gù nke aka-Gi.


Lepum anya, ka m'we b͕asa irum, Tutu mu ala, ghara inọ kwa ọzọ n'uwa.


N'ezie ọ bu n'onyinyo ka madu nējeghari: N'ezie n'otù nku-ume ka ha nāb͕a aghara: Ọ nākwakọba àkù, ma ọ maghi onye gāchikọta ha.


Nání otù nku-ume ka ndi di ala bu, ọ bu kwa okwu-ugha ka ndi di elu bu: N'ihe-ọtùtù ha gàrigo elu dika ihe nfe; Ndi ahu nile n'otù di nfe kari otù nku-ume.


O we me ka ubọchi nile ha gwusia n'otù nku-ume, O me-kwa-ra ka arọ nile ha gwusia n'obi-ọlulọ-miri.


O we cheta na anu-aru ka ha bu; Ifufe nke nālafe alafe, we ghara ilaghachi.


M'we kpọ ndu asì; n'ihi na ọ jọrọm njọ, bú ọlu nke aluworo n'okpuru anyanwu: n'ihi na ihe nile bu ihe-efu na ichọ ijide ifufe.


Ha gārọputa kwa ọnwu kari ndu, bú ndi nile fọduru, ndi fọduru site n'ab͕uru ọjọ a, ndi fọduru n'ebe nile M'chusaworo ha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke ndi-agha puta.


Ma ub͕u a, Jehova, biko, wepu ndum n'arum; n'ihi na ọ kam nma inwu ọnwu kari idi ndu.


O rue, mb͕e anyanwu wara, na Chineke guputara otù ifufe Iru-anyanwu di ọku; anyanwu we tikwasi Jona n'isi, ike we gwusia ya, o we riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, Ọ kam nma inwu ọnwu kari idi ndu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan