Nwayi ahu we si, Jehova, bú Chineke-gi, nādi ndu, Ọ dighi ob͕e achicha m'nwere ma-ọli, ma nání otù nju-aka utu ọka n'okpokoro, na nwantī manu n'ite: ma, le, anamachikọta nkú abua, ka m'we ba, were ya doziere onwem, dozi-kwa-ra nwam nwoke, ka ayi we rie ya, nwua.
M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! le, emerughi nkpuru-obim: erighkwam ihe nwuru n'onwe-ya, ma-ọbu ihe anu dọb͕uru, site na mb͕e m'di na nwata we rue ub͕u a; ọ dighi kwa anu nke bu ihe-árú bàworo n'ọnum.
O we sim, Nwa nke madu, le, M'gaje ib͕aji nkpa-n'aka, bú achicha, nime Jerusalem: ha ewe rie achicha n'ọtùtù na nime ncheb͕u; ha gāṅu kwa miri n'ọtùtù na n'anya ọ nēju ha: