Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 6:4 - Bible Nso

4 N'ihi na àkú nile nke Onye puru ime ihe nile di nimem, Nke ńsí-ha ka mọm nāṅu Ihe-egwu Chineke nēdo onwe-ha n'usoro imegidem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Àkụ Onye pụrụ ime ihe niile gbara dị nʼime m; mmụọ m na-aṅụkwa nsi dị na ha; ihe egwu Chineke edoola onwe ha nʼusoro imegide m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 6:4
30 Iomraidhean Croise  

Iwe-ya adọkawom O we kpọm asì; Ọ takwasiwom ikekere ezé-Ya: Onye-nkpab͕um nāchichapu anya-Ya n'arum.


Usu-Ya nile ndi nāpunara madu ihe nābiakọta, tulie uzọ-ha imegidem, Ma kwa ulo-ikwū-ha buruburu ulo-ikwūm.


Nsi aju-ala ka ọ gāmiri: Ire agwọ gēb͕u ya.


Ka anya-ya abua hu nbibi-ya, Ya ṅua ufọdu nime ọnuma nke Onye Nke puru ime ihe nile.


Ihe-egwu echighariwo imegidem, Ha nāchu ọkakam dika ifufe; Dika igwe-oji ka nzọputam gabigawo-kwa-ra.


N'ihi na nhuju-anya Chineke burum oké egwu, Site kwa na nweli-elu-Ya apughm ime ihe ọ bula.


M'gēkwu okwu-ugha megide ikpém? Ọnyá-àkum adighi ngwọta, ọ bu ezie na njehie adighi.


Asi na emehiewom, gini ka m'nēme Gi, Gi Onye nēche madu? N'ìhi gini ka I doworom ibu ihe-ndakwasi n'ebe I nọ, M'we ghọrọ onwem ibu?


Bú Onye nēji oké ifufe chifiam aru, Onye nēme kwa ka ob͕ub͕u-mmam, bú nke eb͕urum, ba uba n'efù.


Zam ngwa ngwa, Jehova; mọm agwusiwo: Ezonarilam iru-Gi; Ka m'we ghara iyi ndi nārida n'olùlù.


O we b͕a àkú-Ya, me ka ha b͕asa; Ọtutu àmùmà kwa, O we chusa ha.


N'ihi na I gēme ka ha b͕akuta azu, I gēji udọ̀-uta-I dozi àkú imegide ha n'iru.


N'ihi na àkú-Gi nile efedakwasiwom, Aka-Gi adakwasiwokwam.


Ọ dighi izu-okè ọ bula di n'anu-arum n'ihi iwe-Gi; Ọ dighi kwa udo ọ bula di n'ọkpukpum nile n'ihi nmehiem.


Àkú-gi nile bu ihe di nkọ; Ndi nile di iche iche nāda n'okpuru gi; Àkú-gi di n'obi ndi-iro eze.


Ọ bu kwa imegide ya ka O doziworo ihe nile nke ọnwu; Ọ nēme àkú-Ya ka ha buru ihe nēre ọku.


Obi mara ilu nke aka ya; Ọ bu kwa n'ọṅù-ya ka onye nke nābughi nke ya nādighi-agwakọta onwe-ya.


Mọ madu gānagide ọria-ya; Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u, ònye gēburu ya?


Mb͕e ọ bula ọ nāgabiga ọ gējide unu; n'ihi na kwa-ututu ka ọ gāgabiga, n'ehihie na n'abali: o we buru nání ọma-jijiji ighọta ihe anuru.


Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya dika onye-iro, O werewo aka-iri-Ya guzo Onwe-ya dika onye-nkpab͕u, We b͕ue ndi nile anya nāchosi ike: N'ulo-ikwū nke ada Zaion ka Ọ wusiworo ọnuma-Ya dika ọku.


N'ezie, mu ka Ọ nātughari aka-Ya megide ọtutu mb͕e ogologo ubọchi nile.


N'oge hour nke-iteghete Jisus we were oké olu tie nkpu, si, Eloi, Eloi, lama sabaktani? nke bu, ma asugharia ya, Chinekem, Chinekem, gini mere I ji rapu nání Mu?


Ya mere ebe ayi matara egwu Onye-nwe-ayi, ayi nēme ka madu kweye, ma emewo ka ayi puta ìhè nye Chineke; anamatukwasi kwa obi na emewo ka ayi puta kwa ìhè nime akọ-na-uche-unu.


M'gēme ka àkúm nile ṅubiga ọbara okè, Mma-agham gēri kwa anu-aru; Site n'ọbara ndi eb͕uru eb͕u na ndi adọtara n'agha, Site n'isi ndundu onye-iro.


_O si ha, Unu akpọlam Naomi, kpọnum Mara: n>ihi na Onye Nke puru ime ihe nile meworom ihe-ilu nke-uku.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan