25 Le ka okwu-ọnu nke ziri ezi si di irè! Ma gini ka iba-nba nke si n'ọnu-unu puta nābara?
25 Eziokwu na-egbu mgbu nʼobi! Ma gịnị ka ịrụ ụka unu na-ewepụta?
Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na unu ab͕asi nkiti! Ọ we ghọro unu amam-ihe.
Ùnu si kwa aṅa kasiem obi n'efu, Ebe nání nmekpu fọduru nime nzaghachi nile unu?
Ma ọ buru na ọ dighi otú a ub͕u a, ònye gēme ka amara na abum onye-ugha, Me okwum ka ọ buru ihe-efu?
Le, unu onwe-unu nile ahuwo ya; N'ìhi gini kwa ka unu nāghọsi ihe-efu?
Ọzọ, megide ndi-eyì-ya atọ ka iwe-ya di ọku, n'ihi na ha achọtaghi ihe-ọziza ha gēji ma Job ikpe.
Okwu-gi nēme ka onye nāsu ngọngọ guzosie ike, I nāb͕a kwa ikperè nēruru ala ume.
Zínum ihe, mu onwem gāb͕a kwa nkiti: Me-kwa-num ka m'ghọta ihe m'mehieworo n'amaghi-ama.
Ùnu nēchè na unu gābara okwu nba? Ebe okwu-ọnu nile nke onye nādighi-atukwasi obi-ya n'ihe di ka ifufe.
O nwere onye nēkwu okwu nēchèghi echè dika ndupú nke mma-agha: Ma ire ndi mara ihe bu ihe nāgwọ madu.
Ọṅù diri onye ọ bula n'ọziza-okwu nke ọnu-ya: Ọzọ, okwu ekwuru na mb͕e-ya, le ka o si di nma nke-uku!
Ọnwu na ndu di ire n'aka; Ọzọ, ndi nāhu ya n'anya gēri nkpuru-ya.
Nkpuru-osisi apple ọla-edo nime nkata ọla-ọcha Ka okwu ekwuru na mb͕e kwesiri ya bu.