Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 6:14 - Bible Nso

14 Onye obi nālọ ya miri kwesiri inwe ebere site n'aka eyì-ya; Bú onye nārapu kwa egwu Onye Nke puru ime ihe nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 “Onye ọbụla nʼejichi ebere site nʼebe enyi ya nọ na-agbakụta egwu Onye pụrụ ime ihe niile azụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 6:14
16 Iomraidhean Croise  

Abraham we si, N'ihi na asirim, N'ezie ọ dighi egwù Chineke di n'ebe a; ha gēb͕ukwam n'ihi okwu bayere nwunyem.


O rue, mb͕e ubọchi nile nke ọṅuṅu-manya-vine-ha gasiri buruburu, na Job zìri do ha nsọ, o we bilie n'isi-ututu, sure àjà-nsure-ọku, dika ọnu-ọgugu ha nile si di: n'ihi na Job siri, Eleghi anya umum ndikom emehiweo, b͕akuta kwa Chineke azu n'obi-ha. Otú a ka Job nēme ubọchi nile.


E, gi onwe-gi nēmebi egwu, Nēbilata kwa ntughari-uche n'iru Chineke.


M'gēwere ọnum b͕a unu ume, Nmeghari eb͕ub͕ere-ọnum gēb͕ochi kwa ihe-nb͕u-unu.


Merenum amara, merenum amara, unu onwe-unu, bú ndi-eyìm; N'ihi na aka Chineke emetuwom n'aru.


Na mb͕e nile ka eyì nāhu n'anya, Anāmu kwa-nwa-nne bayere ahuhu.


Ezé nyajiri anyaji na ukwu chikwa-puru echikwapu Ka itukwasi onye-nghọb͕u obi n'ubọchi ahuhu bu.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, Kpenu ikpe ezi-okwu, nwe-kwa-nu ebere na obi-ebere nile, onye ọ bula n'aru nwa-nne-ya:


Ma ibe-ya zara, we bara ya mba, si, Gì onwe-gi adighi-atu egwu ọbuná Chineke, ebe i nọ n'ọmuma-ikpé ahu?


Nēsonu ndi nāṅuri n'iṅuri ọṅu; nēsonu ndi nākwa ákwá n'ikwa ákwá.


Ọ buru kwa na otù ihe nke di n'aru nāhu ahuhu, ihe nile di n'aru ahu soro ya nāhukọ ahuhu; ọ buru kwa na anēnye otù ihe di n'aru otuto, ihe nile di n'aru ahu soro ya ṅurikọ ọṅu.


Ònye nādighi ike, nke mu onwem nēsoghi ya n'adighi-ike? ònye ka anēme ka ọ ma n'ọnyà, nke mu onwem nēreghi ọku n'ihi ya?


Nēburitanu ibu nānyi ibe-unu, nēdebezu-kwa-nu iwu Kraist n'uzọ di otú a.


Nēchetanu ndi nọ n'ab͕u, dika ndi ekekọworo unu na ha n'ab͕u; nēchetanu ndi anēmejọ, dika ndi unu onwe-unu nọ kwa n'aru.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan