Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 5:15 - Bible Nso

15 O we zọputa madu na mma-agha nke sitere n'ọnu-ha, Bú ndi-ob͕eye n'aka ndi di ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ọ na-azọpụta ndị mkpa na-akpa, site na mma agha dị ha nʼọnụ, ọ na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị dị ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 5:15
19 Iomraidhean Croise  

M'we tijie ikiri-ezé nke onye ajọ omume, Si n'ezé-ya tupu anu ọ dọb͕uru.


Ime ka iti-nkpu nke onye nēnweghi ike biarue Ya ruo, Iti-nkpu nke ndi ewedara n'ala ka Ọ nānu kwa.


Ka madu emeruru emeru we ghara ibu eze, Ka ndi nēsiri ndi ahu ọnya we ghara idi.


Ọ nādọputa onye ewedara n'ala na nweda-n'ala-ya. Ọ nēkpughe kwa nti-ha nime nmeb͕u.


Ọ dighi-edebe ndu nke onye nēmebi iwu: Ma Ọ nēnye ndi ewedara n'ala ezi ikpé.


Anēb͕ochi kwa ìhè-ha n'ebe ndi nēmebi iwu nọ, Anānyaji kwa ogwe-aka di elu.


Ọb͕ub͕ọ-uja ọdum, na olu ọdum nāb͕ọ uja, Na ezé umu-ọdum, ka emebiworo.


Oke-ọdum nāla n'iyì site n'enweghi ihe ọ dọb͕utara, Umu nke nne-ọdum ekesawo kwa onwe-ha.


Mb͕e ire nāpia utari agēzo gi; I gaghi-atu kwa egwu ihe-ike mb͕e ọ nābia.


I huwo ya; n'ihi na Gi onwe-gi nēlegide nmeb͕u na nkpasu-iwe, itiye ya n'aka-Gi: N'aka-Gi ka onye nāhuju anya nārapu onwe-ya; Onye nēyere nwa-nb͕ei aka ka I buworo.


I nuwo ihe ndi di ume-ala n'obi nāchọsi ike, Jehova: I nēdozi obi-ha, I nēme ka nti-Gi ge:


Ọzọ, Ọ nēme ka ob͕eye si na nweda-n'ala nọ n'ebe di elu, Ọ nēme kwa ka ọ ghọ ab͕uru dika ìgwè ewu na aturu.


N'ihi na O gēguzo n'aka-nri nke ob͕eye, Izọputa ya n'aka ndi nēkpe nkpuru-obi-ya ikpe.


Amawom na Jehova gēmezi okwu-ikpe onye ewedara n'ala, Na ikpé ziri ezi nke ndi-ob͕eye.


Ọkpukpum nile gāsi, Jehova, ònye di ka Gi? Gi Onye nānaputa onye ewedara n'ala n'aka onye di ike kari ya, I nānaputa onye ewedara n'ala na ob͕eye n'aka onye nānapu ya ihe n'ike.


Ọ gēkpe ndi ewedara n'ala n'etiti ndi-Gi ikpe, Ọ gēnye umu nke ob͕eye nzọputa, Zọpia kwa onye-nmeb͕u.


Nebukadreza, bú eze Babilon, we nye Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, iwu bayere Jeremaia, si,


Chineke we nye Daniel ka enwe ebere na obi-ebere nile n'aru ya n'iru onye-isi ndi-onozi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan