Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 42:12 - Bible Nso

12 Ọzọ, Jehova gọziri ikpe-zu Job kari nmalite-ya, o we nwe orú nnù ewu na aturu na nnù iri-na-ise, na nnù camel iri-na-ise, na nnù ehi ise ejikọrọ abua abua, na nnù nne-inyinya-ibu abua na ọgu iri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gọziri Job nʼoge ikpeazụ nke ndụ ya karịa ka o si gọzie ya na mbụ. Job nwere puku atụrụ iri na anọ na puku ịnyịnya kamel isii na puku ehi abụọ na otu puku ịnyịnya ibu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 42:12
15 Iomraidhean Croise  

Jehova agọziwo kwa onye-nwem nke-uku; o we di uku: O nyewo kwa ya ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, na ọla-ọcha na ọla-edo, na orù-ndikom na ndinyom nēje ozi, na camel na inyinya-ibu di ọtutu.


ọgu nne-ewu iri na orú nkpi, ọgu nne-aturu iri na orú ebulu,


Ọ̀ bughi Gi onwe-gi b͕aworo ya, b͕a-kwa-ra ulo-ya, b͕a-kwa-ra ihe nile o nwere, ogige buruburu? I gọziwo ọlu aka-ya abua, ihe-nnweta-ya ab͕asawo kwa n'ala.


Ewe muara ya umu-ndikom asa na umu-ndinyom atọ.


Ihe-nnweta-ya di nnù ewu na aturu iri-na-asa na ọgu iri, na nnù camel asa na ọgu iri, na nnù ehi abua na ọgu iri ejikọrọ abua abua, na nnù nne-inyinya-ibu na ọgu ise, na ndi-orù bara uba nke-uku; nwoke ahu we di uku kari umu Iru-anyanwu nile.


Ọ bu ezie na nmalite-gi di ntà, Ma ikpe-azu-gi gēbù ibù nke-uku.


Ọ nāgọzi kwa ha, ha we ba uba nke-uku; Ọ dighi-eme kwa ka anu-ulo-ha bilata.


Ngọzi Jehova, nke ahu nēme madu ọgaranya, Ọ dighi-atukwasi kwa ya ihe-nwuta.


Ikpe-azu ihe di nma kari nmalite-ya: ọ di nma, bú onye mọ-ya nwere ogologo-ntachi-obi, kari onye mọ-ya di elu.


M'gēme kwa ka madu na anumanu ba uba n'elu unu; ha gāba kwa uba, mua ọmùmù: M'gēme kwa ka madu bi nime unu dika ọnọdu mb͕e ochie unu si di, M'gēme kwa unu nma karia na mb͕e mbu unu: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


Onye nēme ka i rie manna n'ọzara, nke nna-gi-hà nāmaghi; ka O we weda gi n'ala, ka O we nwa kwa gi, ime gi nma n'ikpe-azu-gi:


Nēnye ndi bu ọgaranya n'oge di ub͕u a iwu, ka ha ghara itukwasi uche-ha n'ihe di elu, ghara kwa itukwasi obi n'ihe ahu anējighi aka, bú àkù, kama ka ha tukwasi obi na Chineke, Onye nēwere àkù-Ya nye ayi ihe nile ka ha buru ihe gātọ ayi utọ;


Le, ayi nākpọ ha ndi ngọzi diri, bú ndi tachiri obi: unu nuru ihe bayere ntachi-obi nke Job, hu kwa ihe Onye-nwe-ayi zubere, na Onye-nwe-ayi bu onye nwere ọmiko ri nne, nwe kwa obi ebere.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan