Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 42:10 - Bible Nso

10 Jehova me-kwa-ra ka ndọta-n'agha Job lata, mb͕e o kpere ekpere bayere ndi-eyì-ya: Jehova we tukwasi n'ihe nile Job nwere okpùkpù abua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Mgbe Job kpesịrị ekpere maka ndị enyi ya, Onyenwe anyị mekwara ka ọ baa ụba ọzọ. O nyekwara ya okpukpo abụọ nke ihe niile o nwere na mbụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 42:10
34 Iomraidhean Croise  

Abraham we kpere Chineke: Chineke we me ka aru di Abimelek na nwunye-ya na orù-ya ndinyom nma; ha we mua umu.


Amazaia we si onye nke Chineke ahu, Ma gini ka ayi gēme bayere ọgu talent ise ahu nke m'nyeworo usu ndi nāpunara madu ihe nke Israel? Onye nke Chineke we si, Jehova nwere ihe inye gi nke bara uba kari.


Ewe muara ya umu-ndikom asa na umu-ndinyom atọ.


Ihe-nnweta-ya di nnù ewu na aturu iri-na-asa na ọgu iri, na nnù camel asa na ọgu iri, na nnù ehi abua na ọgu iri ejikọrọ abua abua, na nnù nne-inyinya-ibu na ọgu ise, na ndi-orù bara uba nke-uku; nwoke ahu we di uku kari umu Iru-anyanwu nile.


Elifaz, bú onye Timan, na Bildad, bú onye Shua, na Zofa, bú onye Neama, we je, me dika Jehova gwara ha: Jehova we hu Job iru-ọma.


Mb͕e Jehova mere ka ndi nālata na Zaion lata, Ayi di ka ndi nārọ nrọ.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na nzọputa Israel esi na Zaion puta! Mb͕e Jehova gēji me ka ndọta-n'agha ndi-Ya lata, Ka Jekob tegharia egwú ọṅù, ka Israel ṅuria ọṅu.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na nzọputa Israel esi na Zaion puta! Mb͕e Chineke gēji me ka ndọta-n'agha ndi-Ya lata, Ka Jekob tegharia egwú ọṅù, ka Israel ṅuria ọǹu.


Ọkpukpu-ọlu nke obi ume-ala na egwu Jehova Bu àkù, na nsọpuru, na ndu.


Gwanu Jerusalem okwu gābà ya n'obi, kpọ-kwa-nu ya òkù, si, na obubu-agha-ya ezuwo, na ahuhu ajọ omume-ya atọjuwo Chineke utọ, na ọ natawo n'aka Jehova okpukpu abua n'ihi nmehie-ya nile.


N'ọnọdu ihere-unu unu gēnwe okpukpu: n'ọnọdu-ihere ha gēti nkpu ọṅù n'òkè-ha: n'ihi ya n'ala-ha okpukpu ka ha gēnweta: ọṅù ebighi-ebi gādiri ha.


Mu nwe ọla-ọcha nile, ọ bu kwa Mu nwe ọla-edo nile; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Moses we tikue Jehova, si, Chineke, biko, me ka aru-ya di ike, biko.


Ha we si, Ọ̀ bu ezie na nání Moses ka Jehova wereworo kwue okwu? Ọ̀ bughi kwa ayi ka o wereworo kwue okwu? Jehova we nu ya.


Nzukọ Israel nile we si ka ewere nkume tub͕ue ha. Ewe me ka umu Israel nile hu ebube Jehova anya n'ulo-ikwū nzute.


O we si, Ya mere ariọm gi, nna, ka i ziga ya n'ulo nnam;


Ọ̀ bughi akam mere ihe ndia nile?


O we b͕u ikperè n'ala, were kwa oké olu ti nkpu, si, Onye-nwe-ayi, atukwasila nmehie a n'isi-ha. Mb͕e o kwusiri okwu a, o we da n'ura.


na Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka ndi-gi adọtara n'agha lata, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n'aru gi, laghachi, chikọputa gi nime ndi ahu nile, ebe Jehova, bú Chineke-gi, meworo ka i b͕asa.


Ma i gēcheta Jehova, bú Chineke-gi, n'ihi na Ya onwe-ya bu onye nēnye gi ike imeta àkù; ka Ọ we me ka ọb͕ub͕a-ndu-Ya guzosie ike, nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi imere ha, otú ọ di ta.


Jehova wesa-kwa-ra Eron iwe nke-uku ikpochapu ya: m'we kpe kwa ekpere bayere Eron na mb͕e ahu.


Le, ayi nākpọ ha ndi ngọzi diri, bú ndi tachiri obi: unu nuru ihe bayere ntachi-obi nke Job, hu kwa ihe Onye-nwe-ayi zubere, na Onye-nwe-ayi bu onye nwere ọmiko ri nne, nwe kwa obi ebere.


Jehova nānapu madu ihe, nēme kwa ka ọ buru ọgaranya: Ọ nēme ka adi ala, Ọ nēme kwa ka adi elu.


Ọ nēme ka onye nēnweghi ike si n'ájá bilie, Ọ nēsi n'ebe-ikpofu-ahihia welie ob͕eye elu, Ime ka ha na ndi-isi nọdu, Na ime ka ha keta oche-eze nsọpuru: N'ihi na Jehova nwe ogidi nile nke uwa, O dowo kwa elu-uwa dum madu bi n'elu ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan