Chineke we gọzie ha: Chineke we si ha, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa uwa, buda ya n'okpuru onwe-unu; nwekwanu ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu nile ọ bula di ndu nke nākpu akpu n'elu uwa.
onye-nwe-ya gēme kwa ka ọ biakute Chineke nso, ọ gēme kwa ka ọ biarue nso ọnu-uzọ, ma-ọbu nso awara-uzọ; onye-nwe-ya gēwere arà rapue nti-ya; ọ gābu kwa orù-ya rue mb͕e ebighi-ebi.
Nehash, bú onye Amon, we rigota, ma ulo-ikwū-ya imegide Jebesh-gilead: ndikom nile nke Jebesh we si Nehash, Ka ayi na gi b͕a ndu, ayi gēfè kwa gi òfùfè.