Ahuhu gādiri okpu-eze npako nke ndi Efraim nāṅubiga manya ókè, ahuhu gādi-kwa-ra okoko-ọhia nākpọnwu akpọnwu nke ima-nma-ya mara nma, nke di n'isi nke ndagwurugwu di urù nke ndi manya-vine nēb͕u!
Kwue okwu, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu nēmegide gi, Fero, eze Ijipt, bú ogologo anu ahu nke nāmakpu n'etiti osimiri Nail-ya nile, nke siworo, Mu nwe Nail nkem, ọ bu kwa mu onwem mere ya n'onwem.
Anu-ọhia nke m'huru yi-kwa-ra agu, ukwu-ya di kwa ka ukwu bear, ọnu-ya di kwa ka ọnu ọdum: dragon ahu we nye ya ike-ya, na oche-eze-ya, na oké ichi-isi.