Ha bu okwu ire-utọ, bú okwu ọnu-ya nke di ka miri-ara raru araru, Ma nání agha ka obi-ya bu: Okwu-ya nile di nrò kari manu, Ma okwu ahu bu mma-agha amiputara amiputa.
Ma ub͕u a, ọ buru na unu ege nti n'olum n'ezie, ọ buru kwa na unu edebe ọb͕ub͕a-ndum, unu gābu-kwa-ram ihe nke akam kari ndi nile: n'ihi na ọ bu Mu nwe uwa nile:
ndi siworo ndi-ọhu-uzọ, Unu agaghi-ahu uzọ; ndi siwo-kwa-ra ndi-ọhù, Unu agaghi-ahuru ayi ihe ziri ezi n'ọhù-unu, gwanu ayi okwu ire-utọ nile, hunu ihe-ikwa-emò n'ọhù-unu: