21 Iku-ume-ya nāmunye icheku, Ire-ọku nēsi kwa n'ọnu-ya puta.
21 Ume ọ na-ekupụta na-afụnwu ọkụ icheku. Ire ọkụ na-esitekwa nʼọnụ ya na-amapụ dịka àkụ.
N'oghere-imi-ya abua ka anwuru-ọku nāputa, Dika nke ite anāfunwu ọku na amì nēre ere.
N'olu-ya ka ike nwere ọnọdu-ya, Ọ bu kwa n'iru ya ka obi-ilọ-miri nēte egwú.
Site n'onwunwu nke nēnwu n'iru Ya igwe-oji-Ya nile nke b͕ara ochichiri gabigara, Akú-miri-ígwé na icheku ọku.
Anwuru-ọku rigoro n'imi-Ya, Ọku nēsi kwa n'ọnu-Ya ripia: Afunwuru icheku site na ya.
N'ihi na edowo otù Tofet n'usoro site na mb͕e gara aga; e, nke ahu ka edoziworo nye eze; O mewo ya ka ọ di omimi, me ya ka ọ sa mbara: obo-ya bu ọku na ọtutu nkú; nku-ume Jehova, dika iyi brimstone, nāfunwu ya.
ahihia akpọnwuwo, okoko-ọhia ajunwuwo; n'ihi na iku-ume Jehova ekukwasiwo ya: n'ezie ahihia ka ndi ahu bu.
N'iru Ya ka ajọ ọria nke nēfe efe nāga, Anwuru-ọku si kwa n'ukwu-Ya abua nāputa.