16 Dika otù si nọ ibe-ya nso, Ifufe adighi-abà n'etiti ha.
16 nke ọbụla dị ibe ya nso, na ikuku enweghị ike gafee nʼetiti ha.
Usoro nke ọta azu-ya bu npako-ya, Ha bu ihe emechiri emechi dika agāsi na eji ihe-akàrà siri ike mechi ya.
Anēme ka otù rapara n'aru nwa-nne-ya; Ha nējisi onwe-ha ike, agaghi-ekesa kwa ha.