14 Emesia Mu onwem gēkele kwa gi, Si na aka-nri-gi nāzọputa gi.
14 Mgbe ahụ, mụ onwe m ga-ekwenyere gị, na aka nri nwere ike ịzọpụta gị.
Zobekọ ha n'ájá; Kechie iru-ha n'ebe zoro ezo.
Biko, le otobo, nke M'kèworo gi na ya; Ọ nāta ahihia dika ehi.
N'ihi na ọ bughi mma-agha-ha ka ha ji nweta ala ahu, Ogwe-aka-ha azọputaghi kwa ha: Kama ọ bu aka-nri-Gi, na ogwe-aka-Gi, na ìhè nke iru-Gi, N'ihi na ihe-ha tọrọ Gi utọ.
N'ihi na ọ bughi utam ka m'nātukwasi obi, Mma-agham adighi-azọputakwam.
Ọ bu Onye nēnye onye dara #mbà ike; onye ike nādighi ka Ọ nēme kwa ka ọ nwe ume n'uba.
N'ihi na mb͕e ayi nọ nādighi ike, mb͕e oge-Ya ruru Kraist nwuru n'ihi ndi nādighi-asọpuru Chineke.