I ji iba-nba nile dọ madu aka na nti n'ihi ajọ omume, I we me ima-nma-ya anāchọsi ike ka ọ b͕aze dika nla: N'ezie nání otù nku-ume ka madu ọ bula bu. Selah
Le, I mewo ubọchim nile dika ntu-ọbu-aka; Mb͕e ndum di kwa ka ihe nābughi ihe n'iru Gi: N'ezie nání otù nku-ume ka madu ọ bula bu, n'iguzosi-ike-ya. Selah
Dika ìgwè ewu na aturu, ọ bu ala-mọ ka edoworo ha nye; Ọnwu gābu onye nāzù ha dika aturu: Ndi ziri ezi gēnwe ike n'aru ha n'ututu; Udi-ha bu ihe ala-mọ gēme ka ọ ka nká, ka ebe-obibi ghara idiri ya.
N'ihi na anyanwu nāwalita, ifufe di ọku eso ya, o we kpọnwua ahihia; uzari-ya we dapu, nmá nke iru-ya we la n'iyì: otú a ka ọgaranya gātalata kwa n'ije-ya nile.