ha gāma kwa jijiji; aru-ufu na ihe-nb͕u ka ha gēnwezu; dika nwanyi ime nēme, otú a ka ha gāb͕ali: ọ gēju ha anya, otù n'ebe ibe-ya nọ; iru nke bu nání ire-ọku ka iru-ha gābu.
O we sim, Daniel, onye bu ihe anāchọsi ike nke-uku, ghọta okwu nile nke mu onwem nāgwa gi, gi guzo kwa ọtọ n'ebe-nguzo-gi; n'ihi na ub͕u a ka ezìworom biakute gi: mb͕e ọ kpayerem uka nka, m'we guzo ọtọ nāma jijiji.
Mb͕e ahu ib͕u-maramara nke iru eze b͕anwere, èchìchè-ya nile nēme kwa ka ọ ma jijij; nkwonkwo úkwù-ya nātọpusi kwa, ikperè-ya abua nākukọrita kwa onwe-ha.