14 N'ihi na ọ nārapu àkwá-ya n'ala, Nēme ka ha kpo ọku n'elu ájá,
14 Ọ na-eyi akwa ya nʼala ma hapụ ha ka uzuzu kpoo ha ọkụ.
Nkù nke enyi-nnunu nāṅuri ọṅu; Ma nkù-ya na ábúbà-ya, hà di ebere?
O we chezọ na ukwu gāzọpia ha, Ma-ọbu na anu-ọhia gāzọkwasi ha ukwu.
Dika nnunu nke nēsi n'akwu-ya efefu, Otú a ka madu di nke nēsi n'ọnọdu-ya akpafu.
Ọ gābu-kwa-ra madu ihe isure ọku; o we were ufọdu nime ha, nya ọku; e, ọ funwue ya, we sie achicha: e, ọ nāpi chi, we kpọ isi ala nye ya; o mewo ya arusi apiri api, we da kpue iru n'ala n'iru ya.
Ọbuná nkita-ọhia eseputawo ara, me ka umu-ha ṅua ara: Ada ndim aghọwo onye nēnweghi obi-ebere, dika enyi-nnunu n'ọzara.