Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 38:8 - Bible Nso

8 Ma-ọbu ònye ji ibo-ọnu-uzọ mechibido oké osimiri, Mb͕e ọ waputara dika agāsi na ọ nēsi n'àkpà-nwa puta;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 “Onye kara akara nye osimiri iwu ebe ọ ga-ejedebe mgbe o nupụtara dịka a ga-asị na o si nʼakpanwa pụta,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 38:8
13 Iomraidhean Croise  

Chineke we me mbara ahu, kpa ókè n'etiti miri ahu nke di n'okpuru mbara ahu na miri ahu nke di n'elu mbara ahu: ọ we di otú a.


Chineke we si, Miri ahu nke di n'okpuru elu-igwe, ka achikọta ha n'otù ebe, ka ahú kwa ala-akọrọ: ọ we di otú a.


Imere ifufe ihe-ọtùtù; Miri ka Ọ tùwo-kwa-ra n'ọtùtù.


M'we kpawara ya ókèm, Tiye ihe-ntuchi na ibo-ọnu-uzọ,


Mb͕e M'doro igwe-oji ka ọ buru uwe-ya, Na oké ọchichiri ka ọ buru ákwà-ọkiké-ya,


I were ob͕u-miri kpuchie ya dika uwe; N'elu ugwu nile ka miri nēguzo.


Ndi ahu ahuwo ọlu nile nke Jehova, Na oké ọlu-Ya nile nime miri nke miri emi.


Ọ nāchikọta miri oké osimiri dika obo-ihe: Ọ nētiye ob͕u-miri n'ulo-àkù di iche iche.


Ònye rigoworo n'elu-igwe, we rida? Ònye chikọtaworo ifufe nime nkwukwuba-aka-Ya abua? Ònye kegideworo miri n'uwe-Ya? Ònye meworo ka nsọtu nile nke uwa guzosie ike? Gini bu aha-Ya, gini bu kwa aha nwa-Ya, ma asi na i mara?


Mb͕e O ji kpara oké osimiri ókè-ya, Ka miri we ghara igabiga okwu-ọnu-Ya: Mb͕e O ji turu ntọ-ala uwa ukpuru:


Ònye tùworo miri nile n'ọbu-aka-Ya, were ntù-aka tùputa elu-igwe, nagidezue ájá nke uwa na mb͕é, sì ugwu nile n'ihe-osìsì, tùa ugwu ntà nile n'ihe-ọtùtù?


ọ̀ bu Mu ka unu nādighi-atu egwum? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: ọ̀ gaghi-eb͕u unu nb͕u n'ihi irum? Mu onye doworo ájá ibu ókè nke oké osimiri, site n'ukpuru ebighi-ebi, ọ gaghi-agabiga kwa ya, ọ bu ezie na nmali-miri-ya nile nāmaghari, ma ha apughi; ọ bu ezie na ha nēbib͕o, ma ha adighi-agabiga ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan