Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 38:4 - Bible Nso

4 Òle ebe i nọ mb͕e M'tọro ntọ-ala uwa? Gosim, ma ọ buru na i mara nghọta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 “Ebee ka ị nọ mgbe m tọrọ ntọala ụwa? Gwa m ma ọ bụrụ na ị ghọtara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 38:4
18 Iomraidhean Croise  

Na mbu Chineke kere elu-igwe na uwa.


Ndia bu usoro okike elu-igwe na uwa mb͕e ekere ha, n'ubọchi ahu mb͕e Jehova, bú Chineke, mere uwa na elu-igwe.


Ì bu madu mbu amuru? Ma-ọbu àmuputara gi tutu ugwu adi?


Imere ifufe ihe-ọtùtù; Miri ka Ọ tùwo-kwa-ra n'ọtùtù.


Ònye mere Ya onye-nlekọta uwa? Ma-ọbu ònye doro elu-uwa dum madu bi?


Na mb͕e ochie ka I tọrọ ntọ-ala nke uwa; Ọlu aka-Gi ka elu-igwe bu kwa.


Ha onwe-ha gāla n'iyì, ma Gi onwe-gi nēguzogide: Ha nile gāka kwa nká dika uwe; Dika ákwà-nb͕okwasi ka I gāb͕anwe ha, agāb͕anwe kwa ha:


Ọ tọwo ntọ-ala uwa n'elu ọnọdu-ya guzosiri ike, Ka aghara iwezuga ya n'ọnọdu-ya rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Jehova jiri amam-ihe tọ ntọ-ala uwa; O doziri elu-igwe site na nghọta.


Ònye rigoworo n'elu-igwe, we rida? Ònye chikọtaworo ifufe nime nkwukwuba-aka-Ya abua? Ònye kegideworo miri n'uwe-Ya? Ònye meworo ka nsọtu nile nke uwa guzosie ike? Gini bu aha-Ya, gini bu kwa aha nwa-Ya, ma asi na i mara?


Jehova nwerem na nmalite uzọ-Ya, Tutu ọlu-Ya nile site na mb͕e ahu.


Yà na onye b͕ara ìzù? ònye mere ka Ọ ghọta ihe? ònye zíri Ya ihe n'okporo-uzọ ikpé, zí kwa Ya ihe-ọmuma, me kwa ka Ọ mara uzọ nghọta?


Onye jiworo ike-Ya me uwa, Onye jiworo amam-ihe-Ya me ka elu-uwa dum madu bi guzosie ike, Onye jiworo nghọta-Ya setipu elu-igwe:


N'ihi na, le, Onye nākpu ugwu nile, Nke nēkè kwa ifufe, Nke nēgosi kwa madu ihe bu ntughari-uche-ya, Onye nēme chi-ọbubọ ka ọ b͕a oké ọchichiri, Nke nāzọkwasi kwa ebe nile di elu nke uwa; Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bu aha-Ya.


Ọzọ kwa, Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, na mbu ka I tọrọ ntọ-ala nke uwa; Ọlu aka-Gi ka elu-igwe bu kwa:


Ọ gwara ayi okwu n'ọgwugwu ubọchi ndia nime Ọkpara, Onye O doro onye-nketa nke ihe nile, Onye O site-kwa-ra n'aka-Ya me uwa nile;


Ọ nēme ka onye nēnweghi ike si n'ájá bilie, Ọ nēsi n'ebe-ikpofu-ahihia welie ob͕eye elu, Ime ka ha na ndi-isi nọdu, Na ime ka ha keta oche-eze nsọpuru: N'ihi na Jehova nwe ogidi nile nke uwa, O dowo kwa elu-uwa dum madu bi n'elu ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan