Elaija we za, si onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri ahu, Ọ buru na onye nke Chineke ka m'bu, ka ọku si n'elu-igwe ridata, ripia gi na ọgu ndi-agha abua na iri gi. Ọku we si n'elu-igwe ridata, ripia ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya.
Le, ọku siri n'elu-igwe ridata, ripia ndi-isi abua mbu ahu nke ọgu ndi-agha abua na iri, ha na ọgu ndi-agha abua na iri ha: ma ub͕u a ka ndum di oké ọnu-ahia n'anya-gi.
Moses we si ya, Mb͕e m'si n'obodo pua, M'gāb͕asara Jehova ọbu-akam abua; éb͕è-elu-igwe nile gākwusi, ákú-miri-ígwé agaghi-adi kwa ọzọ; ka i we mara na Jehova nwe uwa.
Ndi Israel we di ka ndi nātamu ntamu, nēkwu ihe ọjọ na nti Jehova: Jehova we nu ya, iwe-Ya we di ọku; ọku nke Jehova we re n'etiti ha, we ripia madu ufọdu nime nsọtu ọmuma-ulo-ikwū.